RAG DAY:Ụbọchị Nkịrịnka Uwe

Spread the love

RAG DAY, ọ pụtara gịnị? Kemgbe izu ụka a, ụmụakwụkwọ nọgasị na mahadum di n’Enugwu dịka IMT na ESCET yi nkịrịnka uwe na-agagharị, na-arịọ ego.

Ha sị na ọ bụ RAG DAY. Ụfọdụ sị na Rag day bụ ụbọchị ụmụakwụkwọ mahadum na-ewepụta kwa afọ iji rịọta ego a ga-eji nyere ndi ụwa na-atụ n’ọnụ aka. Mana ụfọdụ dịka Emeka Oko sịrị na ọ bụ ego ha ji enyere onwe ha aka.

hoo!haa!! kpagharịrị n’Enugwu were ihe bụ uche ọhaneze banyere nkea.

N’Obiagụ, otu onye ọkwọ ụgbọala na-ekweghị ekwu aha yi sị na o nweghị ihe dị njọ na ya bụ Ragday, na ihe a bụ omenala ụmụakwụkwọ mahadum, “Nwanne, ihe a bụ ka ha si eme kwa afọ. Ị na-ajụ m’ ma ọ dị mma, kedu nke gbasara udele na ọkpụ-isi? Ihe m’ mma bụ Obiagụ, Old Park. Jee IMT, ka ị jụọ ndi isi ụlọ akwụkwọ ha”

N’okwu ya n’ogbe Independence Layout, Oriakụ Ngọzị Eze kọwara na n’oge nke ha, ha na-eji ego ha rịọtara na Rag day enyere ụmụaka ndi nọ n’ogige ụmụ ndi enwe nne, enwe nna aka

3 Comments

  1. Mgbe nke anyị, o nwere ego a tụrụ anya na ị ga enye ndị Students’ Union Government, ego ahụ bụ nke a na-ewegara ndị enwe nne enwe nna. Nwataakwụkwọ kwụọ nke ahụ, ego ndị ọzọ niile ọ datara, o tinye ya n’akpa ya. Echeghị m na o ziri ezi ime otu ahụ, maka na ebumnobi Ragday bụ iji nyere ndị enwe nne enwe nna aka.




    0



    0
    1. Biko, aha m abụghị Anonymous, aha m bụ Ngọzị Nwarụnta.




      1



      0

Leave a Reply

Your email address will not be published.