ỌDACHỊ! ỌKỤ AGBAGBUWO NDI NILE NỌ N’ỤGBỌALA NDI NJEM N’ỤZỌ ABỤJA

Spread the love

Oke Ọdachi dapụtara ụnyahụ mgbe ụgbọala Peace Mass si Abụja gbara ọkụ pịa pịa mgbe o nwere ihe mberede n’ụzọ awara awara si Abuja aga Lokoja.

Site n’ozi hoo!haa!! nwetara, ya bụ ụgbọala ndi njem chọrọ ịgafe ogologo ụgbọala “911” bu nama mana onye ọkwọ ụgbọala nya ya bụ “trela” ekweghị ụgbọala ndi njem ahụ gafee.

Nke a mere, ọkwọ ụgbọala ndi njem ahụ jiri chaara ya bụ ogologo ụgbọala. Kama onye ” trela ” ga agawazịrị onwe ya, ihe o mere bụ ịdọnyere ụgbọala ndi njem ahụ ike ya nke meziri ka ọkwọ ụgbọala ndi njem ahụ were gbakpọọ n’ike.

Ozigbo, ụgbọala ahụ nwuziiri ọkụ. Ọ dị mwute na madụ iri n’asatọ nọ n’ụgbọala ahụ tinyekwara onye ọkwọ ụgbọala bụ ndi ọkụ gbapịara agbapịa. Otu onye apụtanwughi.

Anyị nụkwara na onye ọkwọ ụgbọala ahụ ka gbara akwụkwọ izu ụka abụọ gara aga. Otu onye n’ime ndi nwụrụ na ya bụ ọdachi gụnyere Oriakụ Clara Elobuike, onye nke ya na nwa ya nwanyị nọ na ya bụ ụgbọala ndi njem.

hoo!haa!! na-arịọ ndi ọrụ nchekwa, ọ kacha ndi ọrụ nchekwa okporo ụzọ bụ Road Safety n’aha bekee ka ha mara ihe ha mere maka oke arụrụ ala ndi a na-akwọ ogologo ụgbọala na-arụsa ndi ọkwọ ụgbọala ndi ọzọ n’okporo ụzọ

4 Comments

  1. Ewoooo…Ka mkpụrụ obi ha zuru ike na ndokwa. Amen.




    0



    0
  2. Ojogburu udene ma sigbue nkakwu ihe ndi okwo ugboala nnukwu ugbo n’anya na ogologo ezi oyibo.

    Ndi ochichi ga agba nbo tie iwu ga eme ka ha na akwo ugboala ha n’oge chi ojiji ma mekwa ogologo uzo odikwa nma iga aga.

    Ka mkpuru obi ndi nwuru anwu laa na ndo kwa. Amen




    0



    0
  3. Ewooo! ka Chineke nara mkpuru obi ha na ndokwa.




    0



    0
  4. Chukwu mere anyi ebere n’Obodo a . Ka chukwu nabata mkpuru obi ha.




    0



    0

Leave a Reply

Your email address will not be published.