IWOBI ABANYEWO NOLLYWOOD

Spread the love

Alex Chuka Iwobi nwa-afọ Naịjiriya na-agbara egwu bọl Arsenal ihu abanyewo Nollywood site na isonye n’ejije nke a kpọrọ “INPADISU”.

hoo!haa!! chọpụtara na Iwobi wepụtara ohere mgbe ọ nọ ezumike were sonye na ya bụ ejije nke e mebere na Surulere, Legọsị.

Iwobi bụ onye mbuụzọ na ya bụ ejije ebe o ji mma agha ndi samụraị akpa ike dị egwu.
E gosiri ebe ndi omekome na-achụgharị ya na Ọmalịncha nwanyị Nollywood, Somkele Inyamah, ha ana-azọzị isi onwe ha.
hoo!haa!! chọpụtakwara na ọ bụghị ya bụ odogwu Arsenal n’onwe ya mebere agba (scene) dị iche iche ebe e megasịrị ihe ike, ka ọ ghara imerụ aha. A chọtara oyiri ya, onye mebere agba ndi ahụ.

Leave a Reply

Your email address will not be published.