AGBAGBUKWALA ỤKỌCHUKWU NDI KATỌLIK N’ABUJA.

Spread the love

Ndi ana-enyo enyo dịka ndi oji egbe eje, agbagbuela otu ụkọchukwu ndi ụka Katọlik na Gwagwalada dị n’Abuja. Aha ya bụ Rev. Fr. Maikel Akawu

Ọbụ n’ụlọ ahia ukwu, (super market), n’ebe elekere asatọ nke abalị, ka ha wakporo ụlọ ahịa ahụ ma gbagbue ụkọchukwu a, n’ụbọchị Satọdee gara aga.

Rue mgbe anyị nwetara akụkọ a, anyị amabeghị maọbụ ndi ohi maọbụ ndị bịara naanị maka ịgbagbu ụkọchukwu a ka ndi a bụ.

Ụkọchukwu a nke echiri n’afọ gara aga bụ nwa afọ nke mbụ ndi mpaghara ahụ echiri ụkọchukwu n’ebe ahụ bụ Gwagwalada dị n’okpuru ọchịchị Achịdayọsis ụka Katọlik nke Abuja.

Ọnụ na-ekwuru ụka katọlik n’Abuja bụ Rev. Fr. Kris Anyanwụ kwuru n’ọbụ eziokwu na-agbagburu ụkọchukwu a mana, ọ gara n’ihu kwue na ya enwebeghị ike ịkọ ka mmiri siri baa n’opi ụgbọgọrọ na mgbagbu agbagburu ụkọchukwu a. Mgbe akpọrọ ya n’ekwe ntị, ọ sịrị na ya anọghị n’Abuja mgbe ihe a mere. Mana o kwuru na mgbe ya lọtara na ya ga-amata ka akụ oyibo siri kuru mmiri rịa elu.

Anyị enwenwughị ike inweta ọnụ mmiri okwu ọnụ na-ekwuru ndi uwe ojii n’Abuja bụ Anjuguri Manzah n’ihi na ọ zaghị mgbe a kpọrọ ya n’ekwe ntị.

Leave a Reply

Your email address will not be published.