ANA-ACHỌ NDI ỌRỤ “BANK” MMADỤ ITOLU ACHỌ MAKA IZU EGO N’ỌBA EGO.

Spread the love

Ndi uwe ojii ekwuela na ha na-achọ mmadụ itolu bụ ndi ụlọ ọrụ ọba ego achọ, maka ikpa agwa dịka Judas. Nke a mere n’otu n’ime ụlọ nchekwa ego ọgbara ọhụrụ.

Ndi a bụ ndi ekwuru na ha bụ nkịta tara ọkpkpụ anyawara ha n’olu site na iburu ego ndi mmadụ butere ka edowere ha n’ụlọ akụ ahụ.

Ndi uwe ojii malitere ịchọ ndi a site na mkpesa ha siri n’aka ndi ụlọ akụ ahụ nakwa ndi ahịa ha nweta, bụ nke ha jiri kọwapụta na nnukwu ego na-efu afu n’ime ego ha dị n’ụlọ akụ ahụ.

Akpọpụtara aha ndi a ana-achọ achọ dịka, Oshiojum Chibụzọ Wilsịn, Juwon Faromoh, Akanaga Kristan, Lịnda Chekwube, Matiu Akpan, Oluwasoji Ajetumobi, Nelsịn Omuzagha, Ogunlaja Ganiyu nakwa Adeyemi Omitogun.

Onye hụrụ onye maọbụ ndi a, ya kpọtụrụ ndi uwe ojii nọ ya nso.

Leave a Reply

Your email address will not be published.