13 Comments

  1. 1. Onye kpaa nkụ ahụhụ, ngwere abịara ha oriri.
    2. Ọchịchara bụ ome ihe eboro oke.
    3. Ijiji na-anaghị anụ ntị n’eso ozu ala n’ili.




    0



    0
  2. 4. Akpụsị gbaa otule, ya amụrụ akọ.
    5. Nje(ndu) dị n’ime azụ bụ azụ.
    6. Akụ fechaa, ọ dara awọ.
    7. Nwanyị na-ete ofe ogiri mara ijiji anya mpịa.




    0



    0
  3. 1. Ehi n’enweghi odu, chi ya na achuru ya ijiji.




    2



    2
  4. 8. Ihe ka nte bata n’onu nye, nte etepu




    0



    0
  5. 1. Ụkpana okpoko buru, ntị chiri ya.
    2. Agaghị eburu ozu enyi n’isi were ọkpa na-akpa abụzụ.
    3. Aṅụ gbaa nwata, okporoko ijiji atụwa ya egwu.
    4. Agwọ taa nwata, idide abụrụ onye iro ya.
    5. Abụzụ hụụ nke anya ya ekwesịghị ịhụ, ọ were ụkwụ gbapuo onwe ya afọ.
    6. Abụzụ otu ụkwụ na-agba na mbụ ebido.
    7. Anụ dị n’ọhịa bụ mma abọghị ya, ijiji erie ya.
    8. A kpaa nkịta eze, ijiji ebewe ya n’ọnụ.
    9. Agbụsị sị na ọnweghị ọgba nta gbachụrụ ya.
    10. Chi nte chọọ igbu ya, ọ kpapụtara ya ọkụkọ n’etiti ehihie ka ọ tụrịa.
    11. Ijiji ma ụma atụ nkwe na ikpo nsị, ọ dịghị ihe ọ bụla ọ ga-emeṅwu ya.
    12. Ka ihe nile tara n’abalị bụrụ aṅwụnta.
    13. Nwatakịrị na-egwu ọnụ abụzụ nọkata mawa mbazụ ya amawa, ọ bụrụ na ọ bụghị agwọ ka o gwutere mara na ọ hụla ihe yiri agwọ.
    14. Ngwere tụọ ọgụ ya lụọ aṅụ.
    15. Ọnya tap mmadụ ọ mara na ijiji nwere eze.
    16. Ọhịa nwere ebu nwee mfụ, ihe na-agba anaghị eturu ya ọnụ.
    17. Ọ bụ di bi ụnọ ka a na-ahụrụ ji ebe tara.
    18. Ọkụkọ tupuo ọnụ eruruu, ya agbakwala ọsọ.
    19. Ụkpala ahụrụ ahụ na-agụ ọkụkọ ma ya jide nke ya, o rie ya na ndụ.
    20. A naghị anwụrụ aṅụ anwụru etinye n’uji.




    0



    0
  6. 21. Nwanyị na-esi ogiri mara ijiji pnya kpọrọ.
    22. Nwata nne ya na-esi ogiri na-ama ijiji anya mpịa.
    23. Ijiji sị na ya agaghị ekwo maka na ya na-anwụ ọnwụ ike wee hapụ onye ọnya tara ka o si n’ihu ya gafee.
    24. Agbụsị enweghị mma na egbe ma na ọ na-achụ nta.
    25. Chinchi si ụmụ ya nọrọ jụụ na ihe dị ọkụ ga-ajụrịrị oyi.
    26. Ahụrụ a nyụrụ n’elu ṅkwụ gbara ijiji gharịị.
    27. Onye kpara ṅkụ ahụhụ sị ngwere bịara ya ụgwọ.
    28. Isi kote ebu ọ gbaa ya.
    29. Ọ na abụ atụpụ nkịta akpị ma e zighịị ya, ọ dị ka atụrụ ya mbọ.
    30. Ijiji anaghị aba n’ọnya ekwere ekwe.




    0



    0
  7. 31.’Ọ na abụ ududo kụchichaa, ọ were isi nwa ya kụghesịa.
    32. Ijiji so ogiri bịa ahịa ahịa; nke a, o sokwanụ onye bịa?
    33. Ka asị ihe nile tara n’abalị bụrụ anwụnta, ọ bụ ma agwo?
    34. Ụchịcha bụrụgodu nnụ egbe, ọ pụghị ị ga na be ọkụkọ.




    0



    0
  8. 35. Ọ na abụ atọọ ntị n’ala anụ , anụ akwa agbụsị.
    36. Abụzụ tụrụ ọnụ abụzịghị nwa.
    37. Ehi na enweghị ọdụ chi ya na-egburu ya ijiji.
    38. Onye hụrụ igwurube ma ọ kpọghị ụmụnna ya; ndị nke lara ọhịa, onye nwe ha?
    39. Anaghị asị onye tara odudu nụọ mmiri.
    40. Ụmụ ahụhụ sị na ha ma ka ọ ga esi dịrị ha n&ụdụ mmiri kpatara ha ji were ọkọchị na-akpakọba nri.
    41. Onye ọbụla aṅụ gbara na-abụ ọ hụ okporoko ijiji , ọ na-agba ọsọ.
    42. Ijiji sị na ezigbo aha ya bụ “anya nọrọvọ hụ” mana ụmụ ụwa kpọgbụrụ ya n’aha wee ṅa-akpọ ya “ijiji”.
    43. Ana m asị onye mba ya chụpụ ijiji beere ya n’ọnụ , ama m ihe ha ji agba ụtụtụ na be ha.
    44. Ọfọ ka idede ji awa ala.
    45. Ụkpana ntị ike na-anụ ihe n’afọ nnụnụ.




    0



    0
  9. 1. Chinchi si ụmụ ya nwee ndidi na ihe dị ọkụ ga-ajụ oyi
    2. Onye agwọ tara na-atụ idide egwu
    3. Ijiji anaghị anụ ntị na-eso ozu ala n’inyi
    4. Akụ fechaa ọ daara awọ
    5. Onye evu gbara na-atụ okpokpo ijiji egwy
    6. Ikpiri dị na anụ bụ anụ
    7. Egu bụ nwata kudo aka n’osisi tolitezia hapụ osisi aka
    8. Ụtụ anaghị agba igwe
    9. Aka abụọ tigbata, o tigbuo ijiji
    10.Nwa ụkpana na-ere ọkụ, ọ sị na ọ na-agba mmanụ




    0



    0
  10. 46. Ọ na abụ ụkpana nwata ezughị ike, ya agbọnyụsịwa ọkụ.
    47. Odudu bere na mkpụrụ amụ; egbuo ya okwu, ahapụ ya n’ebe ahụ , okwu!
    48. Ijiji ọbụla so anụ anaggị ebu ọnụ.
    49. Ekwesịghị ịnọ n’ihu ọnya egbu ijiji.
    50. Ọ na abụ ahụhụ chekwaa onwe ya nke ọma ya aghọọ ụkpana.
    51. Aṅụ bịara g’ihi mmanya; ijiji bịakwara n’ihi ihe na-esi isi.
    52. Ụchịcha sị na ya amaghị ka ga-esi gbatara agụ ụlọ ọsọ enyemaka ; ya e mee kote okwu.
    53. Abụzụ sị na onye abọwaghị mgbe ibe ya bọwara , ala emechibidocya.
    54.Ijiji ọbụla egburu ebe a nyụrụ ahụrụ lara ndụ ya n’iyi.




    0



    0
  11. 55. Nkịta sị na ya enweghị ike ịri anụ ọbụla ijiji edetụghị ọnụ.




    0



    0
  12. Onye isi olee ọgbụgba okwe asọmmpị ilu a? Ka ụmụ ahụhụ a atagbụchala onye ọbụla?




    0



    0
  13. Author

    ỌGBỤGBA OKWE:UJU NWANEKEZIE 52 (55), MAZỊ IKECHUKWU ỌJỊ 7 (10), DỌKỊNTA ACHỤKỌ 6 (8) , CHIDERA UNAMBA 1(1)

    BIKONU, ỤMỤ NWOKE, UJU ANYỊZỊRỊ ANYỊ?




    0



    0

Leave a Reply

Your email address will not be published.