AKA AKPARALA ONYE ISI NDI BIAFRA ZIONISTS FEDERATION

Spread the love

Ndi uwe ojii nakwa ndi DSS ejikọọla aka ọnụ kpụrụ onye ndu otu Biafra Zionist Federation BZF n’aha ịchafụ, bụ Bejamin Ọnwụka.

Nke a bụ maka ihi mbọ ha na-agba iguzobe mba Biafra ma makwụnye ọkọlọtọ ya n’obi gọọmenti dị n’Enugwu.

Ọbụ n’okporo ụzọ Bisalla Road, nke dị n’Independence Layout Enugwu ka aka nọ kpara nwoke a nakwa ndi otu ya ndi ọzọ mgbe ha na-aga obi gọọment Enugwu iga mejuputa ebum n’obi ha.

Akụkọ anyị nwetara na-ekwu na ndi a si ụzọ Presidential Road, gafere ụzọ Rangers Avenue mana akwụsịrị ha mgbe ha ruru ụzụ si Bissala Road banye obi gọọment Enugwu.

Onye osote onye isi otu a bụ Mazị Amburusu Ugwu kọwapụrara n’ọbụ eziokwu na aka kpaara ndi a ma kwukwa na amabeghị ebe ha nọ ugbu a.

O kwuru na ndi otu ya gawara obi gọọment Enugwu n’ụtụtụ ụnyahụ bụ Mọnde mana akwụsịrị ha n’ụzọ, mgbe ha ruwegoro nso n’ebe ha na-aga.

N’okwu ya, ndi ọrụ DSS gbochiri ha ịba n’obi gọọmenti ma gwa ha ka ha nọrọ n’ebe Bisalla Road mee ihe ọbụla ha chọrọ ime.

Ọ gara n’ihu kwue na onye ndu ha jụrụ ajụ ma kwue na aga-ahapụrịrị ha ka ha banye obi gọọmenti. Ọ sịrị na ka ọ gasịrị nwa obere oge, na ndi a wetara ụgbọ-ala bụ nke asị ha banye ka ha ga nwee mkparịta ụbụbọ.

Ọ sị na, rue ugbu a ya na-ekwu okwu a, na ha anụtụbeghị onu ndi otu ha. O kwukwara sị, na nghọta nke ha, na ndi otu ha a abụrụla ndi atọọrọ atọrọ, n’ihi na-akpụgara ha ebe amaghị.

Mazị Amburusu kwuru na ha agaala n’ụlọ ọrụ ndi nnyocha bụ CID, mana ha ahụghị ha.

“Anyị na-akpọkuzị ndị mba ọzọ, ọ kachasị onye isi ala mba Amịrịka bụ Donad Trọmp na nke mba Izrel ka ha gbata nye aka maka ịkpọpụta ndi a eji eji”.

Ọ sịrị na site n’ozi ya nwetara, na ndi a eji eji karịrị mmadụ iri ise. Ọ sịkwara na ndi a ejighị ngwa agha ọbụla, kama, ha bụ ndi na-alụ ọgụ maka inwere onwe ha. Mazị Amburusu sị na onwere ihe ọbụla mere ndi a, n’ọbụ ndị aka na-achị steeti dịgasị n’ọdịda-ọwụwa anyanwụ ala anyị ka-amaara.

Ganye mgbe anya na-aga n’igwe maka ibiputa ozi a, ndi uwe ojii nakwa ndi nke DSS ewuputabeghị ozi ọbụla maka njide ejidere ndi a.

1 Comment

  1. E kwuola m sị na ndị na-eme ihe Bịafra amaghị ihe ha na-eme.
    Biko onye nta akụkọ, nye anyị akụkọ ọzọ.




    0



    0

Leave a Reply

Your email address will not be published.