ATỌRAPỤLA NDI INYOM BIAFRA EJI EJI

Spread the love


Atọrapụla mmadụ iri na isii bụ ụmụ nwanyị ndi Indigenous People of Biafra, IPOB, bụ ndi akpụpụrụ ụlọ ikpe maaji dị n’Owere, na steeti Imo tata.

Onweghṅ ihe ọzọ a gwara ha ka ha mee belu sọ ha lawara onwe ha.

Ntọrapụ ha kpaliri mụọ ọñụ n’ime ndi otu ha ndi ọzọ bụ ndi na-akwado nnwere onwe Biafra.

Ihe ejiri jide ụmụ nwanyị a na mbụ, bụ na ha na-eme ngagharị ma na-ekwu na ha chọrọ imara ebe onye ndu IPOB bụ Nnamdị Kanụ nọ.

Ụmụ nwanyi a bụ ndi mere ngagharị n’ụbọchị Faraidee n’Owere tupu ejide ha ma kpụtakwa ha n’ụlọ ikpe n’ụbọchị Mọndee, gwara gọọmenti etiti ka-emee ntụli-aka maka imara ndi chọrọ ka enwee mba Biafra.

Ha gara n’ihu kwue na ọbụrụ na-emeghị nke ahụ, na nhọpụta nke afọ puku abụọ na iri na itolu agaghị enwe isi.

1 Comment

  1. Biko ha gaa siere ndị Di ha nri.




    0



    0

Leave a Reply

Your email address will not be published.