Ọzọemena bụzị onyeisioche ọhụrụ NSE,Enugwu

Spread the love

ENUGWU: Otu Nigerian Society of Engineers (NSE ) bụ otu jịkọtara ndi omenka, ngalaba Enugwu nọrọ ụnyahụ n’ụlọ ezumezu DEC n’ogbe Indendence Layout, Enugwu were họpụta ndi isi ọhụrụ nke otu a n’oge ha nwere Ọgbakọ Izugbe Kwa-afọ ha.

Onye a họpụtara dịka Onyeisioche bụ Omenka Festus Ọzọemena, onye bụbu Onyeisioche Okpuru Ọchịchị Igbo-Etiti n’Enugwu Steeti

 Omenka Festus Ọzọemena nakwa Osote ya Omenka Chibụzọ Aka

Ichie Ọzọemena gụrụ akwụkwo ma nwetakwa ọzụzụ na Moscow dị na mba Rọshịa dịka Omenka na ahụ maka ịrụ ụlọ nakwa okporo ụzọ.

Tupu emee ya bụ nhọpụta, udiri okwe ndọrọ ndọrọ ọchịchị a zụrụ kpụ ọkụ n’ọnụ. N’oge gara aga, anaghị azọ ọkwa onyeisioche azọ maka nkwenye dị adị na onye ọbụla bụ Osote Onyeisioche ga eweghara ọchịchị ma onyeisioche chịchaa rituo dika e si eme ya n’ọchịchị izugbe otu NSE nke Naịjiriya nile.

Kaosiladị, ụfọdụ siri ọnwụ na a ga-azọ ya azọ maka na o nweghị ebe e dere mkpebi ahụ n’akwụkwọ. Nke a mere Omenka ọzọ aka sikwara ike bụ Omenka Uchenwa Ụjam jiri pụta ịzọsị ya ya bụ ọkwa.

Nwanyị a bụkwa ochie dike Omenka na-ahụ maka Ọkụ Latrik nakwa Elektrọniks bịakwara kwe Ọzọemena n’aka ozigbo o meriri.

A na-atụ anya na onyeisioche ọhụrụ a ga-arụ ọrụ pụrụ iche iji kwalite ọnọdụ otu a elu ọ kacha ịhụ na ndi otu a kwabara n’ebe ha na-arụ ụlọọrụ ọhụrụ ha

Leave a Reply

Your email address will not be published.