ỤMỤ BIAFRA, KWỤỌ NỤ ỤGWỌ ỤTỤ ISI UNU – Ụwazurike

Spread the love


Ụnyahụ bụ Tọọsdee ka onye ndu ndi otu MASSOB, bụ Ichie Raf Ụwazurike nọrọ gbaa ama na-ebidola lakọtawa ụtụ isi ụmụ Biafra nke afọ a bụ puku abụọ na iri na asatọ. Ọ sịrị na ụtụ isi a bụ otu n’ime ihe ndi ana-eme kwa afọ iji gba mbọ maka iguzobe mba Biafra, na-akpọghị ganị-ganị ọgbaghara ọbụla.

Mgbe ọ na-agwa ndi otu ya okwu, gbasara mkpa ọ dị, bụ ikwụ ụgwọ ụtụ isi a, Ichie Ụwazurike gwara ndi Igbo ka ha na-enwe ọñụ n’ihi na agbụrụ ha bụ Igbo ma were Biafra dịka ihe njiri-mara ha.

Onye ndu ndi MQSSOB a rịọrọ ụmụ Biafra niile, ka ha gbaa mbọ garue n’isi ụlọ ọrụ Biafra ọbụla dị ha nso maka ịkwụ ụgwọ ụtụ isi ha.

O kwuru hoohaa na-anaghị amanye mmadụ amanye maka ime nke a.

N’ozi eweputara bụ nke onye enyemaka ya pụrụ iche maka mgbasa ozi nakwa nta-akụkọ bụ Mazị Kris Anịerobi Mọcha binyere aka n’ime ya, Uwazurike kwuru na atụmatụ ahụ ana-éché ogologo oge maka mba Naijiria abịala. O kwuru na ụmụ ihe ndi a na-emegasị na ala Naijiria tata bụ maka ọdị mma nke mbọ ahụ ana-agba maka Biafra inwere onwe ya.

Ọ sị na ya chọrọ Biafra maka na onyezịghị ya obi ụtọ ịhụ na ndi Igbo ka nọ na Naijiria.

O kpere ekpere ogologo ndụ nye mba Biafra nakwa mba ise ndi ọzọ aga-ekewapụta na Naijiria, ọ sịrị na mpaghara isii enwere na mba Naijiria tata ga-emechaa ghọọ mba ọhụrụ kwụụrụ onwe ha, iji kwụsị oke ogbugbu ana-egbu ndi mmadụ, ikpe mkpegide nakwa ọchịchị nchịgbu enwere na Naijiria.

Ọ gụpụtara mba ndi a dịka: Biafra, nke aga-ekewapụta site n’ọdịda-ọwụwa anyanwụ; Nija-Delta, nke aga-ekewapụta site n’ọdịda-ọdịda anyanwụ; Oduduwa, nke aga-ekewapụta site na ndịda ọdịda anyanwụ; ndi ọzọ bụ Arewa nke aga-esi na mgbago ọwụwa anyanwụ kewapụta tinyekwara etiti ugwu nakwa ọdịda anyanwụ ugwu.

Ụwazurike kwuru na-enwekwara ike na-enwe mmekọrịta mba n’ibe ya dịka o si gbasata azụm ahịa n’etiti mba ndi a kwụụrụ onwe ha ma ha chọọ.

1 Comment

  1. Ọ bụrụ na akwụsịghị ide ihe gbasara bịafra na ọba ozi a, a hara m unu hoohaa.




    0



    0

Leave a Reply

Your email address will not be published.