ENUGWU: OTU NWOKE AÑỤCHAALA ÍGBÓ KWỤGBUO ONWE YA

Spread the love

Ndi uwe ojii na steeti Enugwu amalitela ịma imi n’ala maka ịchọpụta ihe mere otu nwikorọbịa dị afọ iri abụọ na anọ jiri kwụgbuo onwe ya ka oji añụrụ ike ñụjuru afọ ya.

Ọnụ na-ekwuru ndi uwe ojii n’Enugwu bụ Ebere Amaraizu kwuputara ihe ndi a n’Egugwu taa. Amaraizu sịrị na ihe a mere ka ọnwa asatọ n’afọ a dị na mkpụrụ ụbọchị iri abụọ na abụọ n’obodo Ameke Enu, Oduma dị n’okpuru ọchịchị ime obodo Anịnri nke steeti Enugwu.

N’okwu ya, aha nwikorọbịa a bụ Ebube Chukwu.

Ọ sịrị na ekwuru na nwa amadị a jiri aka ya kwụgbou onwe ya ka ọñụbigarachara añụrụ ike oke dịka o si añụ ya awa niile.

Ọ sịrịṅ na Ebube chịrị ụdọ kwụgbue onwe ya n’elu osisi dị n’ọhịa ana-akpọ Obokolo dị n’etiti Amọjị na Ameke Oduma. Akụkọ kọrọ na ihe ejiri mara nwoke a bụ Ebube mgbe ọ dị ndụ bụ ịñụ igbo kwa mgbe kwa mgbe nke kpatara na ya bụ nwa ọkụkọ atụkatala ntụ, were tụrụ icheku ọkụ.

Amaraizu sịrị na ndi uwe ojii amalitela ṅịma imi n’ala, iji mara ka mmiri siri banye n’opi ụgnọgọrọ, n’ihe gbasara ọnwụ nwa amadị a bụ Ebube Chukwu.

Leave a Reply

Your email address will not be published.