NSOGBU ANA-ENWE N’ỤZỌ SI ENUGWU GAWA ỌNICHA GA-ABỤZỊ AKỤKỌ MGBE OCHIE – Gọọmenti etiti

Spread the love

Minisry etiti na-ahụ maka ọrụ ekwuela na akụkọ ana-akọ banyere ahụhụ ndi njem na-ata n’okporo ụzọ awara awara ahụ sị Enugwụ gawa Ọnịcha ga-abụzị akụkọ mgbe ochie n’ime otu izu ụka.

Ma rue ugbu a, ọnọdụ ụzọ ahụ nọ n’ime ya na-agba anya mmiri. Mana ka ihe si gbata kwụrụ kịta, onye ntụzi aka n’ụlọ ọrụ minisrị etiti na-ahụ maka ụzọ dịgasị n’ọdịda-ọwụwa anyanwụ bụ Injinia Ịmanel Adeoye, ekwuela na-ewerela ọrụ ngo idozi ụzọ ahụ nyehachị n’aka ndi ọrụ Rayland Construction Company, RCC, Ọ sịrị na ọrụ ịrụkwa ogologo ụzọ ahụ niile dịzị n’aka ndi ọrụ ngo a bụ nke ọ sị na ha bụ ndi Izrel.

Adeoye sịrị na gọọmenti etiti ekpebiela na ọbụ ndi ọrụ ngo ahụ ga-amalite n’ebe ụzọ ahụ bidoro n’Enugwu rue ebe o jedebere n’Ọnicha. Ọ kwuru na ndi sọvịa enyochaala ka-aga-esi rụkwa yabụ ụzọ, ma kwue hoohaa, n’ọrụ ebirila ọkụ n’ụzọ ahụ.

Adeoye sịrị na ihe ji imalite ọrụ n’ụzọ ahụ rue ugbu a bụ mkpa ọdị na-esoro ihe niile n’usoro kwesịrị ekwesị (due process). O kwere nkwa na akụkọ niile ana-akụ gbasara ụzọ ahụ ga-agbanwe n’ime otu izu ụka.

N’okwu ya, “anyị achọpụtachaala ebe niile kwesịrị idozi nke taa na nke echi n’ụzọ ahụ. Tupu izu ụka a agwụ, ị ga-ahụ n’ọrụ amalitela n’ebe ndi ahụ”…

Leave a Reply

Your email address will not be published.