EBỌNYỊ: NDI NTOROỌBỊA NKE AGBỤRỤ NIILE NA-EKWU OKWU UDO…

Spread the love

Ndi òtù jikọrọ ụmụ ntoroọbịa agbụrụ niile nke Naijiria akpọrọ ‘All Nigeria Ethnic Nationalities Youth Organizatio’, ANENYO, n’aha ichafụ nọrọ ụnyahụ kwue na ha ga-ahụkọrịta ndi aka na-achị steeti dịgasị n’ọdịda-ọwụwa anyanwụ ala anyị; ka-ewere gbaa mbọ ihụ na, ọnọdụ: ‘onye nọrọ na be ya’ ndi IPOB kwuru na-aga-enwe ma ọnwa Septemba dị n’abalị iri na anọ ewetaghị tigbue na zọgbue.

Ndi otu a yọrọ ayịyọ ka ihe ọbụla ndi IPOB ga-eme n’oge ahụ ghara iweta ọgbaghara nke ga-ebuta ịkwafu ọbara na imebi akụnụba ndi mmadụ na mpaghara ahụ. Ha kwuru mkpa ọ dị, ihụ na IPOB gbanwere usoro ha ji eme ihe, iji hụ na ọchịchọ ha na-achọ iguzobe mba Biafra ebuteghị ndi mmadụ ịtụfu ndụ ha.

N’ozi ha weputara n’Abakiliki, onye osote onye isi ndi otu a n’ala anyị niile bụ Mazị Okechukwu Isiguzoro yọrọ ka ndi IPOB werekwa udo mee emume ncheta ọgbụgba afọ nke nnwakpo ahụ awakporo ebe obibi Nnamdị Kanụ, na steeti Abịa.

Ndi otu a kwuru na ha na ndi aka na-achị ọdịda-ọwụwa anyanwụ ga ahụrịta maka mkpa ọ dị ịhụ na mbọ ndi IPOB na MASSOB na-agba maka iguzobe Biafra ebuteghịrị ala Igbo nsogbu.

Ha kwuru na ọ dị mkpa na ụdị ogbakọ ha ga-enwe, ga-eme ka mbọ ana-agba maka iguzobe Biafra bụrụ nke eji udo agba.

Ha kwuru na ebe ọbụ ihe ziri ezi na mba maọbụ ndi ọbụla nwere ikike ime ngagharị iji gosipụta mmegbu ana-emegbu ha, ma chọọkwa ka-esoro usoro iwu mezie ya, na ha na-akpọ oku ka ana-eme nke a n’ụzọ agaghị ebute ileda iwu anya.

Leave a Reply

Your email address will not be published.