ABỊALA HA! NDI NTỌ ATỌỌRỌKWALA ỤKỌCHUKWU ỤKA KATỌLIK ỌZỌKWA!!

Spread the love

Ụkọchukwu ụka Katọlik na-elekọta ụlọ ụka Imanuel, (Emmanuel Catholic hurch) Oviri-Okpe nke dị n’okpuru ọchịchị ime obodo Okpe, na steeti Delta, ka anyị na-anụ na ndi ntọ bu egbe atọrọla ya. Aha ya bụ Rev. Fr. Krisofa Ogaga.

Atọọrọ ụkọchukwu a n’ime mgbe aka na-ebe akwa na ụlọ ụka ndi Katọlik adagbuela otu onye ma merụkwa mmadụ iri n’ise ndi ọzọ ahụ n’ime otu okpuru ọchịchị ime obodo ahụ bụ Okpe nke steeti Delta. Ndi a tọrọ ụkọchukwu ahụ kwuru na-aga-akwụ ha nde naira iri na ise tupu na ha-ahapụ ya.

Ụkọchukwụ Ogaga na-arụkwa ọrụ n’ụlọ ụka Luuk dị asọ, nke Oviri Okpe nakwa ụlọ ụka Juud dị asọ dị n’Aghalokpe. N’otu aka ahụkwa, ụkọchukwu Ogaga bụ onye isi (principal) ụlọ akwụkwọ St. Peter Clavers College, Aghalokpe.

Ọ bụ n’abalị ụbọchị Satọdee ka-atọọrọ ụkọchukwu a mgbe ọ na-aga Wọrị maka inyere ụkọchukwu ụlọ ụka Nne nke onye nzọpụta (Mother of Redeemer Catholic Church) nke dị na njikọ ụzọ gara ọdụ ụgbọ-elu, n’Efurun, aka maka ụzọ ụka atọ ha ga-aka n’ụbọchị ụka ya.

Akụkọ na-ekwu na ụkọchukwu Ogaga naanị ya ji ụgbọ-ala ya aga n’ụzọ sị Arava gawa Oviri-Orere-Okpe, nke bụ ụzọ esi aga Wọrị, bụ ebe ndi ntọ a nọ tọrọ ya. Onweghị onye nwere ike ikwu kpọm kwem, ebe anọrọ tọrọ ụkọchukwu a n’ụzọ ahụ.

Onye isi ndi uwe ojii na steeti Delta bụ Mazị Muhammad Mustafa kwuru na nke a bụ ihe mere eme ma kwukwa na ndi ọrụ ya amalitela ọrụ ịchọ ụkọchukwu a.

Ọ sịrị, ‘éé, anyị amalitela ịchọ ndi ntọọ a. Ọbụ n’ime abalị abụọ gara aga ka ha tọọra ụkọchukwu a’. O kwuru na aga-eme ihe niile ha nwere ike ime, maka ịchọpụta ụkọchukwu a nke taa na nke echị.

Leave a Reply

Your email address will not be published.