8 Comments

  1. 1. Nne ewu na-ata agbara, ụmụ ya a na-ene ya anya n’ọnụ.
    2. Ọ na=agbọ ihe ewu na-eri.
    3. Anaghị edebere ewu ji ka ọ nedo ya anya.
    4. Okenye anaghị anọ n’ụlọ ewu anwụọ n’ọgbụ.
    5. Ewu ataa m igu n’isi.
    6. Ejighi abalị achọ ewu oji.
    7. Onye nwe ọgọdọ ewu na-ata?
    8.Ewu na-anyire ọdụ ya , sị na ya na-emegbu onye nwe ya.
    9. Ewu richaa ihe onye ubi, ya fee oke ala.
    10. Ewu rie ji ngwere na-ekwe n’isi, ewu erighi ji ngwere na-ekwe n’isi.




    0



    0
  2. 11. Ihe afọ hụrụ saa ehi e gbuo ya, anụ ya ga-eju ụkpa, ma ọ bụrụ ewu e gbuo ya agaghị ahụ anụ ya anya.
    12. Ka e jiri ewu maa atụ, asị agụ buru ya.
    13. Nw ewu ga-egbu ikpere abụọ n’ala tupu ṅụta nne ya ara.
    15. Onye bu igu ka ewu na-eso.
    16. Ọ na abụ etobe nwa ewu , ya asọjie ụkwụ ya.
    17. Mkpi nkugowe anaghị agba ewu.
    18. Ọkụkọ anaghị ericha nsi, eze eree ewu.
    19. Mgbe ma mgbe ọkụkụ jiri mara ihe, a gụị ya na Ewu.
    20. Ike gwụ nne ewu, ọ rachawa ọkwa.




    0



    0
  3. 21. Mụọ gbanụ gbanụ na-eri ewu akpịkpa ntị.
    22. Ihe atụrụ ji ka ewu ogologo nọ na ọdụ ya.
    23. Ọgbọ nri ewu anaghị agbọ ụbọchị onye nwe ewu ga-abịa.
    24. Ọ na abụ ewu tiwaa ite, ọ nyara akịrịkọ eju n”olu.
    25. Ewu ọbụla nwụrụ n’ọba ji abụghị agụụ gburu ya.
    26. Ewụ ọbụla ọha na-enye nri na-anwụkarị na agụụ.
    27. Ọsịsọọ na-esu ewu kama ajị ekweghị ka ahụ ya.
    28. Akụgbuo nwa ewu, ahụ onye nwe ya.
    29. Ihe a na ahụghị n’ike ṅne ewu, ekwesịghị ịhụ ya na nke nwa ya.
    30. Gbara gbara ka ewu na-anyụ; ọ nyụọ kwụrụrụ, ọ bụrụ otoro.




    0



    0
  4. 31. Ị chọwa ịkpụrụ atụrụ jụrụ ụla, ị ṅwụrụ nwa ya, o sowe gị.
    32. Ihe atụrụ hụrụ sụọ ụde, ka ọkụkụ hụrụ na-atụ.
    33. Atụrụ na-awa mkpị, ekwu sikwaa ya ike.
    34. Agbụrụ ji iwe akwụ ụgwọ, agbọghọ ewu anaghị eme ebe abụ.
    35. Atụrụ sị na ọ na abụ ya na-eleru anya n’ala, ụmụ anụmanụ ibe ya asị na ya dị nzuzu.
    36. Atụrụ sị na ọ bụ eziokwụ na ya amaghị agba egwu, mana akụrụ egwu bata na be nna ya, ya awụliwe elu.
    37. Atụrụ mụrụ ebini gba aka nwa.
    38. Abalị emela atụrụ, ọ dị ya ka ọ nwere mpi eji na-aga ọgụ.
    39. Ọ bụ naanị onye bi n’ụlọ mara ada nne ewu.
    40. Ọ dịghị mma na ntị ịnụ na Ewu tara nshịkọ.




    0



    0
  5. 41. Ọ dị mma ka e were ụtụtụ chọwa ewu ojii n’ihi na chi jie, ya na abalị abụrụ otu.
    42. Ọ na abụ atụrụ na-anụre ọdụ ya, ọ sị na ọ bụ onye nwe ya ka ọ na-emegide.
    43. Ụmụnna na-abọ ewu tara ahụ.
    44. Otu mmụ nwa, otu mpu atụrụ.
    45. Ewu ọbụla dina n’ala dina n’akpụkpọ ya.
    46. Ọnwụ egbuchughị nwa ewu, aka ga-erurịrị ya n’ikenga.
    47. Atụrụ sị na ile anya bụ ọrụ na onwe ya.
    48. Onye nna ya na-akpa atụrụ anaghị atụ mkpụrụ anya ọbụla egwu.
    49. Ofeke keta ntị ewu n’oke, mmanụ agwụ na ọkụ.
    50. Ụmụnne naabọ nya ọzọ ebini; a ga-akpọzi ha nwanne atụrụ?




    0



    0
  6. Author

    1. Ewu na-akpa n’ụkwa amaghị na ụkwa na-etigbu ewu
    2. Atụrụ sị na e buru egwu bịa n’ama nna ya, ọ maghị agba agba ya awụliwe elu
    3. Atụrụ mụrụ ebili gba aka nwa
    4. Ebili laa azụ ọ bịa ọgụ
    5. Ewu a hụrụ n’ọba bụ ya tara ji
    6. Ewu dina n’ala dina n’akpụkpọ ahụ ya
    7. Ewu anaghị ata ji sowe nke na-ata ji, o bido tawa ji
    8. Nwa atụrụ na-amụ ịsọ mpi ekwo ga-aka ya ak
    9. Ewu ọha na-enye nri agụụ na-egbu ya
    10.Nne ewu na-agba afọọnụ, a na-eke ya eke




    0



    0
  7. 1. Onye riri ewu eji chuo aja ji agbara ugwo.
    2. Mkpughari na eji ere nwa mkpi.
    3. Onye anu ewu erughi si na o na ato aja aja.
    4. Anaghi eji uko ukwa ata nsi ewu.
    5. Nani ewu onwu na agu n’ akpo Agu ihe oriri




    0



    0
  8. Author

    ỌGBỤGBA OKWE: UJU NWANEKEZIE 50(47), MAZỊ IKECHUKWU ỌJỊ 10(8), DUMEBI ỌJỊ (5) (5)




    0



    0

Leave a Reply

Your email address will not be published.