ỌKWA MMADỤ NWE ỌGỌDỌ EWU NA-ATA? ỤLỌ A GA-ASỤGBUKWA MMADỤ!

Spread the love

Ótù ụlọ oriri na ọñụñụ dị n’Ọka eji Grand Riviera mara na-akwadozị ịda maka nnukwu ike mbuze na-akpa na-akụkụ ya.

Ọbụghị sọ ụlọ oriri na ọñụñụ a ka mbuze a na-eyi egwu. Ebe ndi ọzọ gụnyere, ụlọ ikpe ukwu steeti Anambara, nakwa ụlọ ikpe ụkwu ala anyị. Ụlọ ikpe ndi a bụ naanị nzọm-ụkwụ ole na ole site n’ebe ụlọ oriri na ọñụñụ a guzoro.

Onye nlekọta ụlọ oriri na ọñụñụ a bụ Mazị Tagbo Igboka sịrị na mbuze malitere kpochapụwa aja ukwu ụlọ ahụ eri afọ abụọ gara aga. Ụlọ oriri na ọñụñụ a agbala afọ iri na abụọ.

Mazị Igboka kwuru na ndi nlekọta ụlọ oriri na ọñụñụ a emefuela ego dị nde naira iri abụọ maka igbochị mbuze a nakwa idozi ihe ndi ọ na-emebi, kemgbe ọ malitere kpasowe ha ike.

Ụlọ oriri na ọñụñụ a bụ nke amaara ama n’Ọka, ndi isi ala anyị abụọ ejirila ebe ahụ mere ebe ndowe ise dịka ndi ọbịa mgbe ha bịara Anambara, tinyekwara ndi aka na-achị steeti ndi ọzọ nakwa ndi minista. Igboka kwara arịrị were kwue, “ma lee, mbuze na-achọzị ikwatụ ya”. Ọ gara n’ihu kwue na n’ime afọ iri na abụọ ụlọ oriri na ọñụñụ a nọgoro, na ha na mbuze agbaala mgba ihe dịka afọ ise, ebe ha mefugoro, opekata mpe, ego dị nde naira iri abụọ.

2 Comments

  1. Biko ha kwọọ ya bụ mmiri oge ọ ka nọ n’obo ọkpa.




    1



    0
  2. Olee ihe gomenti Anabara n’eche iji gbatara ndia oso enyemeaka?




    0



    0

Leave a Reply

Your email address will not be published.