LỌKPANTA:ỤGBỌ EHI ADỌCHIELA ỌZỤ AWARA AWARA

Spread the love

Lọkpanta: Ụgbọ ala bụ ehi adọchiela akụkụ abụọ nke ụzọ awara awara si Enugwu gaa Pọt Hakọọtụ n’ihu ahịa ehi bụ Gariki nke dị na Lọkpanta Abịa Steeti.

Nke a meziri ka ndi njem hapụzịara ha ya bụ ụzọ awara awara nke Gọọmentị Etiti ma tinyezie isi n’ụzọ ime obodo tigwochara etigwo nke sitere n’Ụmụelem, Isuikwuatọ were pụta Ihube, Ọkigwe.

Ndi ntorọbịa obodo dịgasị n’ụzọ ahụ jizi ya kpara ego site na ịdọchị osisi ụzọ na-anazị ụtụ ụzọ. Ọdụ ụtụ ụzọ (tollgate) ha tinyere ruru asatọ

Ma ndi agha ma ndi ọrụ nchekwa obodoo DSS gafetara mana kama ịchụpụ ndi ọkwọ ụgbọala ji ụgbọala gwongworo bu ehi dọchie ụzọ Gọọmentị Etiti, ha soro ndi ọzọ gbawa ya bụ ụzọ ime obodo

1 Comment

  1. Aghọtaghị m, ụgbọala ahụ ọ dara ada ka a kpacha anya dochie ya ụzọ?




    1



    0

Leave a Reply

Your email address will not be published.