ARỤ NA-EME! PASTỌ EYIPULA NWANYỊ NA-ACHỌ NWA ỌBANTE YA N’IME ỤLỌ ỤKA!!!

Spread the love

Ụwa anyị nọ n’ime ya dịzịkwa egwu. Ụfọdụ kpọrọ ihe na-eme ugbu a ọ”gwụgwụ oge”, ebe ndi ọzọ kpọrọ ya “ụwa mmebi”

Ebe ihe niile jiri na-agbagwoju mmadụ anya bụ na ndi akpọrọ ka ha bịa gwụọ anya odo bu akpa ose n’aka abịa.

Ihe nke apụtara bụ na ọtụtụ ndi ụka atụrụ anya na ha ga na-eme ka ihe dị mma na-emezikwa nke edoghị ndi mmadụ anyị.

Na mgbe ochie, ndi gbasara ozi ọma nke Chineke mere ya n’ụzọ o doro ewu na ọkụkọ anya nọbụ ọrụ Chukwu ka ha bịara rụọ. Ọtụtụ n’ime ha dịka Jọn nke mmiri Chukwu, Pọl dị asọ ma Jizọs n’onwe ya tinyekwara ndi ọzọ, ji ndụ ha chụọ aja maka agam n’ihu ozi ọma.

Kịta ọtụtụ ihe mgbawa obi na-emezịkwa, ọkachakwa n’ọtụtụ ebe akpọrọ ụlọ ụka.

Nke akpụ n’ọnụ ugbua bụ na otu onye pastọ amabeghị aha ya nakwa ebe o si, ka eweputara n’ọba ozi ikuku ebe ọ na-ekpere otu nwanyị na-achọ nwa ekpere n’ụlọ ụka ya.

Ọ bụghị na-okpere nwanyị a ekpere bụ isi okwu kama na-ọ sịrị nwanyị a yipu ọbante ya ma gbasaa ụkwụ ya n’ihu ndi bịara ụka tupu na ya ekpebe yabụ ekpere, ka afọ ime were banye ya n’afọ.
Mgbe nke a na-eme, pastọ a amaghị na enwere onye ji ekwe ntị nke nwere ihe eji ese onyonyoo na-esekọrọ ihe ọ na-eme. Eri mgbe nke a mechara, onyonyoo a na-efezị ka nnụnnụ n’ikuku, were aga ebe niile. Tufiakwa!

1 Comment

  1. Ọgwụgwụ oge. Mana ka m jụọ, olee onye sere onyoonyoo a?




    0



    0

Leave a Reply

Your email address will not be published.