ENUGWU:AKA AKPARALA NWANYI ONYE OHI

Spread the love

ENUGWU:Aka akparala nwanyi onye ohi onye na-abanye n’ụlọ ndi mmadụ ezu ohi.

Nwanyị a bụ onye e jidere ka o bara n’ụlọ mmadụ na 12 Boardman Street n’Ụwanị, Enugwu  na mgbede a, zuru ihe ma gbapụ ọsọ.

Ozi anyị nwetara na-ekwu na oteela o ji akpa agwa ọjọọ a Mana, taa ka aka kpaara ya bụ ezekudene.

Ndi uwe ojii bịaziri buga ya n’ulọ ọrụ ha mpaghara nke Ụwanị ka ndi mmadụ tichara ya ihe.

Onye o zuru ohi n’ụlọ ya bụ Okechukwu Nwagbọgụ sịrị na ya nọ n’ụsọekwu n’azụ ụlọ mgbe nwanyị onye ohi rịbatara lee anyi, o nweghi onye ọ hụrụ, o were baa n’ụlọ ya ga buru akpa nwanne ya nwanyị were gbapụ ọsọ.

Ndi uwe ojii bịara iburu ya kọwara na nwanyị ahụ bụ “onye nṅụrụ ihe “, ya bụ “jonkie”

Ihe o zuteere gụnyere akpa ụmụ nwanyi na-eko (handbag) nakwa ihe eji ege egwu ( earphone )

hoo!haa!! were na-ajụ sị, ọ bụrụ na a kụgburu, ọ bụrụ maka ihe ndi a? Ọ kwa maka na ọ bụ Enugwu. Ọ bụrụ Aba ma ọ bụ Ọnịcha, a kọọ ya n’akụkọ.

1 Comment

  1. N’ezie, nwaanyị ahụ nwere ike ịbụ Jonkie dịka ndị uweojii kwuru




    0



    0

Leave a Reply

Your email address will not be published.