ENUGWU: NWATA AKWỤKWỌ AFỌ IKPEAZỤ MAHADUM AKWỤGBUELA ONWE YA.

Spread the love


Otu nwata akwụkwọ nọ n’afọ nke ikpeazụ ya na Mahadum Gọdịfrị Okoye dị n’Enugwu akwụgbuela onwe ya.

Nke a mere mgbe ọ fọrọ nwa abalị ole na ole ka o lenwoo ule ya n’akụkụ agụmagụ ndi nke ọ dara ada.

Ndi ya na ha so agụkọ akwụkwụ gosiri ihe mgbagwoju anya maka onwu nwoke a bụ onye nke ha sịrị na ọ na akpaso ndi mmadụ agwa ọchị mgbe dum. Ha na-eche na onwere ebe ọzọ mmiri siri baa n’opi ụgbọgọrọ.

Etu o sina dị, ha nọ n’ime nnukwu iru uju maka ọnwụ onye otu ha, nke akpọrọ aha ya dịka Desmọnd.

Dịka akụkọ siri kọọ, “Desmọnd bịara akwụkwọ ụnyahụ, maka ịbịa lenwo ule ndi agụmagụ ọ dara ada, mana ụtụtụ a, ahụ ebe ozu ya koro n’elu”

Ndi uwe ojii abịala bupu ozu Desmọnd.

Leave a Reply

Your email address will not be published.