“NDI ỌCHA NNA HA DỊ OJI” ALỌHACHITELA ALA IGBO, ALA NNA HA!!!

Spread the love

Ọtụtụ ụmụ Naijiria si na mba Amịrịka na Kanada, bụ ndi nke esi na nnyocha ọbara ha mata na agbụrụ ha si n’ala Igbo, enweela mkpebi ịlọhachite ala nna ha na steeti Anambara.

Akụkọ anyị nwetara na-ekwu na mmadụ iri n’ime ndi Igbo mba Amịrịka na Kanada ndi a, ka anabataworo ma tinye ha mmiri-chukwu-igbo dịka ụmụ nne ndi Igbo nwoke na nwanyị.

Abara ha aha Igbo ma nyekwa ha ala ebe obibi.

Ọ bụ n’Agụlụeri, nke dị n’okpuru ọchịchị gọọmenti ime obodo Ọwụwa-Anyanwụ Anambara na steeti Anambara ka emere emume nnalabata ndi a mgbe emere oriri ‘Eri’ n’isi nso a.

Leave a Reply

Your email address will not be published.