7 Comments

  1. 1.Imi bewe anya e soro ya bewe
    2. Ọsụsọọ na-agba ewu mana ajị dị ya n’ahụ ekweghị
    3. ahụ ka ntị ịnụ ihe
    4. ọkụ tụkwasa nwanyị tụkwasa nwa ya n’ahụ, o buru ụzọ tichapụ nke dakwasịrị ya
    5.Nwa ewu dina n’ala dina n’akpụkpo ahụ ya




    0



    0
  2. 1. Ọ bụghị onye tara ahụ riri onwe ya.
    2. Ọ gara iyi aghụghị ahụ, ọ nọ n’ụlọ ka ya mma.
    3. Ọkụkọ onye ọrịa nwere, anaghị ahịa ahụ ọbụrụ nke dibịa.
    4. Ọbụrụ na ọ nweghị ihe dị akpa ajị n’ime , anaghị ekechi yp ọnụ.
    5. Nkịta sị ndị ya tụrụ ute wenatara ya ego ya, na ntukwu amarala ya ahụ.
    6. Nwata daa ibi, ọ nyịkata ya aro, ọ mara ya ahụ.
    7. Nwoke na-alụ nwanyị mechiri ahụ, ọ dị ka ndị obodo ya a na-asọ anụ nchi.
    8. Ịtụ agwa na-aka mma n’ahụ eke ma ọ bụ n’ahụ ọgịnị.
    9. Ebe ewetara nshịkọ abụghị ebe a na-anọ asa ya ahụ.
    10. Enye imi, anya ebewe na enyeghị ya.
    11. Egbe laa ije, ụmụ ọkụkọ emegharị ahụ.
    12. Agwọ zutere ngwọrọ họrọ ebe dị ya mma n’ahụ ya tụọ.
    13. Anyụpụta ahụrụ , kpara aka n’imi buzi asị.
    14. Atụchaba akpịrịkpọ dị n’ajị, onye yi ya agbara ọtọ?
    15. Ahụ sị na ya bụ otu ma ọ nọdụ ala ike ekewaa.
    16. A na-ama nwa odu n’ajị.
    17. Ihe ọjọọ mara ahụ, ọ dị ka omenala.
    18. Nwata na-asa ahụ n’afọ n’afọ.




    0



    0
  3. 1.Nsi ojii amarala nwa nkịta ahu
    2. Nwayi di ya dara ibi, ihe ukwu amarala ya ahu
    3. Ahụ ka akwa
    4.




    0



    0
  4. 19. Ọ dịrị ọkụkọ mma ọ were aja na-asa ahụ?
    20. Ihe ọ masịrị mmiri maa Ọgazị , akịka ya ga-adịrịrị ya n’ahụ.
    21. Ọ bụ n’ihi apụghị dimkpa ka imi ji arịsịsị mmadụ?
    22. Tupu mgbe onye nwụrụ anwụ ga-eji lọ ụwa, onye tara ahụ edochiela.
    23. A na-egbu mbe edobe ọra, ọ nwere mkpamkpa anụ dị na ahụ Mbe.
    24. A maa atụ, e rie ahụ ahịa.
    25. Ọ gba egwu na ahụ ya na-alụ.
    26. Ọ chụ ngwere na nkịtị, aghọ ngwere akọkwala ya n’ahụ.
    27. Ihe e ji aga egwu ọnwa bụ ka ahụ na ahụ metụkọọ; ọnweghị onye ọnwa anaghị eti na be nna ya.
    28. Onye tara ahụ nochie uzọ, ọ dị ka ọ na-arịọ arịrịọ.
    29. Ama ka mmiri ama ọgazị, agwa ya apụghị ịpụ n’ahụ ya.
    30. Udele sachara ahụ jụọ ụmụ ya ọ makwara mma? Ụmụ ya sị ya na o tinyekwuola ihe na njọ ya!
    31. Ọ na abụ emezitere nwanyị ọhụụ ebe ọ na-asa ahụ, mmiri ya a na-ada vọm vọm.




    0



    0
  5. 32. Ọrịa mara ahụ, ọ naghị ekwe ngwọta.
    33.Nwata gbere igbe sọọ m ọkụ n’ahụ, e gbere m igbe sọgwara ya.
    34. Ọ ma akwa asa ahụ ma onwe ya.
    35. Mmiri mara ugo sara ya ahụ.




    0



    0
  6. 36. Ọ chụ n’ike na-ala n’ike; ọ je ṅa nwayọ anaghị emerụ ahụ.
    37. Ọ na abụ onye sị, ‘ ha ma’, ọ ma ya n’ahụ.
    38. Ọ na abụ atọ atọ n’ọgụ, ọ haa ahụ.
    39. Ọ bụ n’ihi ahụ adịghị mma ka e ji egbu ichi n’anya.
    40. E sighị n’amụ edo ahụ.




    0



    0
  7. 41. Nkịta sị na metụta ahụ bụ ụtọ nwanne.
    42. Ọ bụ anya ihere ejiri buli mma ka e ji egbu ya n’ahụ
    43. Mbe sị na ọlu ọha a maka ma na oriri ọha na-agbakasị ahụ.




    0



    0

Leave a Reply

Your email address will not be published.