20 Comments

  1. 1. Nkịta richaa ndị, eze erewe ewu
    2. nkịta nyara akpa, nsị agwụ n’ọhịa
    3. kama nkịta mmadụ ga atagbu nkịta m, ka nkịta m tagbuo nke onye ọzọ
    4. esikwa ụzọ ite abụọ n’ọkụ nkịta agbagbuo onwe ya n’ọsọ
    5. ihe nkịta ji esoro onye afọ ukwu bụ na ọnyụghị anyụ, ọgbọọ agbọ
    6. anaghị ere ọkụkọ ọkpa jiri n’ụlọ
    7. ọkụkọ bịa ebe ọmaghị, o jiri otu ọkpa kwụrụ
    8. ọkụkọ nyụọ ahụ, ala achụwa ya ọsọ
    9. anaghị ama ọkụkọ ọcha n’ofe
    10. ọkụkọ nwa ogbenye bụ ehi ya




    0



    0
  2. 1.Oke no n’ulo gwara nke no n’ama na azu di na ngiga
    2. Anu ulo obula nwere nwanne ya no n’ohia
    3. Okuko hapu kwom O ga-eji Gini zuo Umu ya
    4. A na-ebugodi Uzo chupu egbe biara ibu Umu okuko tupu ajuba Okuko ihe mere O ji chiri umu ya puta n’ezi
    5. Aka na ikpere Ala Ka nwa Ewu ji añu Nne ya ara
    6. Nwa agu azuru n’ulo aburula anu ulo
    7. Nkita Nwanyi zuru na-ata ata
    8. Na anu bi n’ulo abughi na nke bi n’ohia ka ya ike
    9. Ndu anu ulo do onye nwe ya n’aka
    10. Okuko Siri na ihe ya ji añu mmiri eluli anya elu bu na omaghi ebe onwu ga-egbu ya ga-esi abia
    11. Nne ewu na-ata ahihia nwa ya a na-ele ya anya n’obi.
    12. Okuko Siri na ihe mere ya ji ebe akwa na etikwa mkpu ma egbe buru umu ya abughi na onwere ihe O puru ime ka n’obu ka uwa nuru olu ya.




    0



    0
  3. 1. Anaghị ere ọkụkụ ụkwụ arụ n’ụlọ.
    2. Mkpi mbogobe anaghị agba ewu.
    3. Nwa ọkụkụ n’erughi eru akpọ chọrọchọrọ, egbe n’ebughị ya, ufu eburu ya.
    4. Ọkụkụ sị ihe ya ji ele anya n’elu añụ mmiri bụ maka ihe n’egbu ya si n’elu abịa.
    5. Ọkụkụ hapụ nma gburu ya ewere ite iwe.
    6. Ọkwa lewe ka esi ahụsi anụ ọkụkụ maka ọ bụ ka agasi ahụsị anụ ya.
    7. Anaghị eji akwa ọkụkụ ahụrụ n’anya achụ aja.
    8. Ọkụkụ nwata bụ ehi ya.
    9. Ọchụ nwa ọkụkụ nwe ada, nwa ọkụkụ nwe mwemwe ọsọ.
    10. Atụrụ sị onweghị ihe karịrị ile anya.
    11. Ọkụkụ mmanya n’egbu ahụbeghị ufu ara n’agba.
    12. Ọkụkụ nyụọ ahụrụ, ala achụwa ya ọsọ.
    13. Ihe nkita ji eso onye afọ ukwu bụ ọnyụghị anyụ ọgbọọ agbọ.
    14. Ọkụkụ chụwa gị ọsọ n’ụtụtụ gbalaga maka onwere ike ojiri abali puo eze.
    15. Ọkụkụ sị ihe mere ya jiri lagbuo ụra abụghị na afọ juru ya, kama chi ejiela.
    16. Akwa ọkụkụ dị mma iji akpọ edere anwụrụ, kama kụtụ ya aka.
    17. Umuji agụ abụghị ihe nkita chekubere ita.
    18. Emee agụ okpo onye ikpe, ikpe ama atụrụ.
    19. Ihe nkịta hụrụ gbalaga ka ọkụkụ hụrụ atụ ọnụ.
    20. Ọkụkụ sị ya hapụ mbọmbọ,kedụ ihe o ji azụ ụmụ.




    0



    0
  4. 21.Ihe nkita ji-eso onye afo ukwu bu ma o nyughi anyu, o gboo agbo.

    22. Nkita anaghi ata okpukpu a nyawara ya n’olu.

    23. Oke nkita na-awa akwa, o na-ekwe agu mgba?

    24. Onye akpiri ka agwunsi ya na-awa nkita, o si na o kaa ya agu.

    25. Nkita nyara akpa, nshi agwula n’ohia.

    26. Nkita anaghi ata aka na-enye ya nri.

    27. Nkita nyara akpa, anu agwula n’ohia.

    28. Nkita nwanyi kpoo anaghi agba niga niga.

    29. Ogbu nkita enyo ite, o bu ya mgbu mbu?

    30. Anaghi eji utali akpo nkita ka o bia rie nshi.

    31. Nkita si na ya noro na-eche uwa ya, a si na ya ehigbuole onwe ya n’ura.

    32. Nkita mmadu na-agwa ya nshi.

    33. O kaa mma mgbe nwa okuko bu ozu nkita eje.

    34. Anaghi enye nkita anu jide.

    35. Uro nkita bu onye daara ibe ya, ibe ya a daara ya.

    36. Emekwata anu nkita, ya aguwa ogaranya.

    37. Nkita si o na-abu ya gwa umu mmadu ka ha chuo aja ndu, ha si na ya choro i racha obara.

    38. Onwu na-egbu nwa nkita na-ebu uzo kpochie ya imi.

    39. Nkita na-ara nshi, eze na-ere ewu.

    40. Aburu na-akpa nkita anaghi eji aka ekpo nshi.

    41. Ihe aturu huru legbuo n’anya ka nkita huru na-agbo uja.

    42. Ihe ejina ite ola shiere nkita nri, o ghaghi inyu nshi ojii.

    43. Akpo nkita foo-foo, kpo ya bio-bio, ma o gbajighi ukwu, ya agbajie aka.

    44. Onye na-achupu nkita na nshi, o ya ga-eri ya?

    45. Mgbe nkita ga-anwu, o naghi anu ushi nshi.

    46. Nkita wepu odu o ji-achu ijiji, o werekwenu gini chuo ijiji?

    47. Ibaa mbubaa anaghi egbu nkita.

    48. Nkita si n’uja ka ya ji-ekele onye biara na be ya, kama olu ike ya ekweghi ka obia mara.

    49. Nkita si na eji oso agbanari onwu, ya gaahara inwu anwu n’uwa.

    50. Nkita rioro ka atupuru ya okpukpu n’ezi ma hapuru ya na ndi mmuo ogu.




    0



    0
  5. 1. Nwa!mkpi sị gbara ya afa ndụ sị hapu nke uto, n’ihi na onye dị ndụ ga-eto eto.
    2. Nkịta chụwa nchi ya na ya bụ ọgbọ.
    3. Nkịta nọbu na-anya ọkụ ụgụrụ wee pụọ.
    4. Nwamkpi nọ be m gbawa afụọnụ ma mụ gbawa, anyị ga-ama onye ga-eji ibe ya aga ahịa.
    5. Nwaologbo sị anụ ya chụrụ ọsọ, ọ gbaghị ọsọ, ya agaghị eri ya.
    6. Nkịta nọrọ n’uche asị na ya na ụra na-eme.
    7. N’ezie anụ nile na-afụ opi ma nke nkakwụ kacha.
    8. Nkịta anaghị ajụ oku kama ọ hụ ozi.
    9. Nwata anụ juru aka na-eji nkuaka achụ nkịta.
    10. Na mpi ka a na-ejide oke ehi.
    11. Nkịta sị ndị ya tụrụ ute wenatara ya ego ya, na ntukwu amarala ya ahụ.
    12. Nkịta anaghị anyụ nsị ebe a na-atọsara ya nri.
    13. Nkịta na-agbọ ụja sị na ya na-azọ ndụ ekperima na-azọkwa ndụ onye nwe ya.
    14. Nkịta rimara utu anụ, ọ hụ onye dara ibi, ọ na-egbu ọdụ fịnị fịnị.
    15. Nkịta sị onye a jala ya ike ọsọ, n’ihi na ọ ọnweghị mgbe ya ji na-agba ya ji na-agba ọsọ na-awakwa ọgọdọ.
    16. Nkịta sị na ọ bụ anụ hụrụ ya gbawa ọsọ ka ya na-achụ.
    17. Mkpụgharị ka e ji ere nwamkpi, ma mkpụgharị ka nwamkpị ji efu.
    18. Lee ya jide na ọ bụ oke, hapụnụ ya na ọ bụkwa nkrkwụ.
    19. Kama agụụ ga-egbu ezi, o rie nwa ya.
    20. Ka e jiri ewu maa atụ, a sị agụ buru ya?




    0



    0
  6. 51. Nkịta nyara akpa nshị agwụ n’ọhịọ

    52. Nkịta rịe nsị ese eree ewu.

    53. Tụpụrụ nkịta ọkpụpkụ n’ezi,hapụrụ ya na ụmụ mmụọ ọgụ

    54. nkita na agbọ ụja anaghi ata arụ.

    55. Nkịta ndaa tara akwa ọkụkụ ndaa

    56.nkita nwanyi zụrụ n’ata ohi akwa

    57. Nkịta ndaa tara ọkụkụ ndaa

    58.Nkịta n’akpọ ụja adịghị ata arụ

    59. Ọdịghị mma nkịta ịta ọkpụkpụ anyabara ya n’olu

    60. Ọnwụ nâ egbu nwankịta anaghị ekweya anụ isi nsị.

    61. Nkịta sị na ihe o ji eso onye afọ ukwu bụ na ọ nyụghị
    anyụ, ọ gbọọ agbọọ.

    62. Nkịta na-anaghị anụ ntị na-aga eri nshi ya.

    63. Nkita adighi mma ita ọkpụkpụ anyanyere ya n’olu

    64. ọnwụ gbụrụ agụ owuu hụ nkita, o bee ya olu

    65.Ọnwụ g’egbu nwa nkịta, ọnaghị ekwe ya nụ ushi nshị.

    66.Imi nkịta dịrị gị mma,bere ya taa

    67.Onye sị na ya anaghị ata anụ nkịta, ya ahapụkwala mmiri ofe ya

    68. otu ụbọchi nkita mmanya na egbụ ga ezụte nnawịṅiri ede ara na ayi.

    69.Nkịta sị ihe ya ji eso onye afọ ukwu bụ ọ na-anyụghị anyụ,ọ gbọọ agbọọ

    70. Ọkụkụ mmanya n’egbu ahụbeghị nkịta ọhịa ara n’agba(n’ayị)

    71.Ụsụ si nkita na ya ma ka ọ jọrọ wee jiri uchichi aga

    72. Umeji agụ abụghị ihe nkịta chekubere ịta

    73. onye rere nkita ga zụta enwe ihe ntukwu ka nọ kwa n’ulo ya

    74.Isi waba nkịta ara, ọmajijiji amawa ụjọ

    75.nkita si na ije ya na dinta kụrụ ya ahia maka na ya aṅụghi mmiri anụ nke ya na ekete ego eretere n’anụ ya so gbuo

    76.nkita si na ya agahi akụ mgbalụ eri nri maka na enweghi anụ ga azọsi ya.




    0



    0
  7. 21. Ị chọwa ijide oke ehi, chọwa oke mmadụ.
    22. Ị chọwa ị mata oke, tinyere ya azụ n’ọṅya.
    23. Ị chọwa ị kpụrụ atụrụ jụrụ ụla, Ị nwụrụ nwa ya o sowe gị.
    24. Ihe atụrụ hụrụ sụọ ude ka ọkụkọ hụrụ na-atụ.
    25. Ije nwamkpi na nkịta bụ ije oriri.
    26.Ị chọọ ịhụ ọchị nkịta, Ịnye ya ji dị ọkụ.
    27. Ị jụta isi nkịta Ị ga-eji agba ya mee gịnị?
    28. Ihe afọ fụrụ saa ehi e gbuo ya, anụ ya ga-ejurịrị ụkpa, ma ọ bụrụ ewu e gbuo ya agaghị ahụ anụ ya anya.
    29. Ewu rie ji ngwere ekwe n’isi, ewu erighi ji ngwere na-ekwe n’isi.
    30. Ehi ọha nwe na-arahụ n’agụ.




    0



    0
  8. 77.Ọkụkụ nyụọ ahụụ, ala achụwa ya ọsọ

    78.Ọchụ nwa ọkụkụ nwe ada,nwa ọkụkụ nwe mwemwe ọsọ

    79.Àkwá ọkụkụ jie akị, ihere emee nkume

    80.Ọkụkụ n’aga warawara, anya n’ele warawara n’ele ya

    81.Ọkụkụ mmanya n’egbu, ezutebeghị nkịta ọhịa ara n’agba

    82.Ihe ehi hụrụ gbaa ọsọ ka ọkụkụ hụrụ na-atụ ọnụ

    83.Ụkpana gbabara na ikpu ọkụkụ na-ala ala mmụọ

    84Ọkụkụ sị na ihe ya ji ele anya n’elu ma ya na-añụ mmiri bụ maka na ihe n’egbu ya si n’igwe abia

    85.Ọkụkụ n’ewere ite iwe,chetakwa nma gburu ya

    86.Ọkụkụ n’erubeghị na ubu n’akpọ chọrọchọrọ, égbé n’ebughị ya, ufu eburu ya.

    87.Nne égbé mụọ nwa, ụmụ ọkụkụ ebegbuo onwe ha n’ákwá

    88.Ákwà ọkụkụ mara mma eji eme ede anwuru ma ọbụ onye g’akụ ya kpọrọkpọro.

    89.Ọ dị mma ka ikuku buo k’anyị hụ ike ọkụkụ

    90.Ikuku buo, ahụ ike ọkuku.

    91.Ọkụkụ hapụ mbọmbọ o jị gịnị azụ ụmụ ya.

    92.Onye hụ ka ọkụkụ na-abụ nshị, ya chụpụ ya maka onweghị onye ma onye ga-ata agbịrịgba ụkwụ ya.

    93.Onye hụ ka ọkụkụ na-abọ nshị, ya chụpụ ya maka onweghị onye ma onye ga-ata agbịrịgba ụkwụ ya

    94.Ọkụkụ n’ejighi ego o ji alụ nwunye, ya nwee ike ọsọ

    95.Ọkụkụ onye ogbenye bụ ehi ya

    96.Anaghị ejị ọkụkụ tere mmanụ achụ aja

    97.Ọkụkụ lee k’esi egbu/ahụsị anụ ọkwa, otu ahụ ka aga esi egbu/ahụsị ya

    98.Ọkụkụ gbawa ajị, ya gbafọ na-agbịrịgba ụkwụ ya, k’ahụ ebe aga ete ya ọgwụ.

    99.Ọkụkụ sị ụmụ ya; ha n’akpagharị, ha n’ele anya n’elu maka ihe n’egbu ha si n’elu abia

    100.Leezie anya ka ịghara/ịhapụ ị bụ ọkụkụ zụchara ụmụ gbara aka ụmụ.

    101.Ọkụkụ bụ aja aghaghị ihe agwụgwo.

    102.Agaghị achụ aja hapụ itinye ọkụkụ

    103.Ọkụkụ na-achụghị ka-ejiri ya chụọ aja, ya tee onwe ya mmanụ.

    104.Ọkụkụ hapụ kwụọkwụọ ọ g’eji gịnị azụ ụmụ

    105.Ọkụkụ anaghị arọ ofe.

    106.Ọkụkụ sị na ya nọ n’ime ite chịcharara.

    107.Ọkụkụ sị ọkwa kwusị iti mkpu maka ewii zọwara akwa ya, ya bụrụkwanụ ya bụ ọkụkụ ana eji akwa ya na ya achụ aja

    108.Onye aja otu ọkụkụ warala, were otu akwa ọkụkụ nye arụsị maka eku ya na ọtakwụ ya nọ n’ime ya

    109.Ọkụkụ n’abọ mbọmbọ sị ụmụ ya riwe nri, ụmụ ya asị ya nke nọ n’ihu ka

    110.Ákwà ọkụkụ gbara ọsọ, dibia kpara ya aka.

    111.Ọkụkụ kpụchaa ụtara, ya bianụ suru ya n’ofe

    112.Ihe ọbụla ọsọrọ ọkụkụ ya mee, ọ gaghị anyụ mmamịrị

    113.Ọkụkụ sị na ya labara ụra abalị maka chi ejiela, ọbụghị maka afọ juru ya

    114.Ọkụkụ sị na ya n’eti mkpu ka ọha nụrụ olu ya, ọbụghị ka ihe ji ya aka hapụ ya.

    115.Ihe ọkụkụ hụrụ n’abọ, ewu ahụchala ya gba nkiti/mechie ọnụ

    116.Ihe ọkụkụ jiri buo ibu bụ aji/abụbụ ya

    117.Ihe ọkụkụ n’achụ oge mmiri n’ezo/ na mmiri dị ya oke mkpa

    118.Otu onye nwe ọkụkụ ma oha mmadụ nile nwe olu/ iti mkpu ya.

    119.Ọkụkụ nwa mbịa(ogbenye) na ewu onye eze anaghị akpakọta ụrị

    120.Akwa ọkụkụ dị mma iji mee iko anwụrụ ma agakwa akụtụ ya aka.

    121.Ọkụkụ m hụrụ n’anya, agaghim eji akwa ya achụ aja




    0



    0
  9. 122. Ewu nwụrụ n’ọba ji abụrụ agụrụ gburu ya.
    123. Beta anụ beta anụ bụkwanụ n’ahụ ehi.
    124. Atụrụ n’achọ ipu mpi, gaa jụọ ebule ka ekwu dị ya.
    125. Nne ewu n’ata agbara, ụmụ n’ele ya anya n’ọnụ.
    126. Elewe ukwu egbuo ewu
    127. Onye bu igu ka ewu n’eso.
    128. Ebule abụọ n’añụ mmiri na otu ite, ga-asọkọta mpi.
    129. Isi ehi anaghị agbọ n’ite.
    130. Anaghị achọ isi ehi n’ite.
    131. Mmịrị anaghị akọ n’ahụ ngwere.
    132. Oke soro ngwere maa mmiri,ya kụọla ngwere ọgaghị akụrụ oke.




    0



    0
  10. 31. Ejula na-agbọgbụ onwe ya , ọ sị na ya na-agbọnyụ ọkụ.
    32. Ihe ọkụkọ hụrụ malie elu, chee n’ọbụ ụkpala a bụghị ụkpala.
    33. Ebe nkịta gbadebere ọsọ ka ndụ dudebere ya.
    34. Ejula ụlọ bụ ejula nsị.
    35. Ebe nwamkpị na-akpụ amụ n’ala bụ na be onye nwe ya.
    37. Egbe laa ije, ụmụ ọkụkọ emegharịa ahụ.
    38. Ebie nkịta ọdụ, ya yie nne ya.
    39. Egbe na-efe n’elu , ụmụ uriom a chịrị ume n’aka.
    40. Chi fo ọkụkọ e nwe di.
    41. Chi nte chọọ i gbu ya, ọ kpapụtara ya ọkụkọ n’etiti ehihie ka ọ tụrịa.
    42. Anaghị e ji ụganị enye nkịta olulo.
    43. A na-esi n’ọdụ ama ihe dị nkịta mma.
    44. A kpaa nkịta eze, ijiji ebewe ya n’ọnụ.
    45. A taa ufu ụta makana oriri ọkụkọ, a jụọ ọkụkọ ị gara gịnị ufu jiri rie gi.
    46. Agbụrụ ji iwe akwụ ụgwọ, agbọghọ ewu anaghị eme ebe ahụ.
    47. Agaghị eji maka mgbarụ ihu nwamkpi ghara iji ya aga ahịa.
    48. Agadị nwanyị anaghị agba ọsọ ma ewu eburubeghị akpa aka ya.
    49. Anụ ọbụla gbara ọsọ ka oke, nwaologbo arịa ya elu.
    50. A chọọ igbu nwamkpị na-eso mma, ndụ ya a na-eto ogologo.
    51. Atụrụ sị na ọ na abụ ya na-eleru anya ala,:ụmụ anụmanụ ive ya a sị na ya dị nzuzu.
    52. Atụrụ sị ọ bụ eziokwu na ya amaghị agba egwu, mana akụrụ egwu bata na be nna ya, ya wuliwe elu.
    53. Ajọ ọkụkọ na-akpata ihe a na-eji esiri akwa ya.
    54. Akwa ọkụkọ bụ ọkụ, nke ọgazị bụ ihe oriri.
    55. Akpọọ nkịta ụzọ oku n’abụ ọ bọnye onwe ya aja n”anya.
    56. Ọ dịrị ọkụkọ mma ọ were aja na-asa ahụ.
    57. A na-esi na eju ama ọkụkọ ga-abụ oke.
    58 Abalị emela atụrụ, ọ dị ka ọ nwere mpi pbụọ
    59. Nkịta nwanyị zụrụ na-ata akwa ọkụkọ.
    60. Anụ na-anaghị a gbara nkịtp ọsọ abụghị nke oriri.




    0



    0
  11. 11:45pm.
    Ka chi bụọ nụ.




    0



    0
  12. 133. Ire ọma ka eju ji aga n’ogwu.




    0



    0
  13. 134. Ọkụkụ anaghị echefu onye furu ya ọdụ na odu mmiri.




    0



    0
  14. 135. Nkịta mụrụ asaa dị mma, ma mgbe ọzọ ya amụla.
    136. Nkịta na onye nwe ya gwuwe egwu, ya ọdịka ọnaghị ata arụ.




    0



    0
  15. 137. Obi dị m ka nwaologbo tagburu oke.




    0



    0
  16. 61. Nkịta na ndị nwe ya na -egwu egwu ọ dị ka na ọ naghị ata ata.
    62. Onye hụrụ ka ọkụkọ na-aga ọ dị ka ọ nweghị nsogbu dịrị ya ma dibịa bịa o were nke ya, egbe bịa o buru nke ya, agwọ bịa ọ tugbuo ụfọdụ, loo ụfọdụ mgbe ha ka nọ n’akwa.
    63. Ọsụ akwụ na-eji ọkụkọ ezu ike.
    64. Ọkụkọ hụ ihe yiri egbe, o buru ụzọ zọwa onwe ya.
    65. Ọ bụrụ n’ejighị ụtụtụ, ọkụkọ atụtụkọrọ ihe dịrị mmadụ.
    66. Ọ bụ kpọkọrọm mere nkịta ji agbọ ụja.
    67. Ọkụkọ na-akpagharị ma ọ maghị na ekechala anụ ya.
    68. Ọkụkọ onye ọria nwere, anaghị ahịa ahụ ọbụrụ nke dibịa.
    69. Ọkụ gbara nnabe bu okpu igwe, ọkụkọ bụ ukwu ọwara ọ ga-eme gịnị?
    70. Ọkụkọ sị na ndị nwere isi ka ọgụ osisi dịrị.




    0



    0
  17. 71. Okenye anọkwa n’ụlọ ewu a mụọ n’ọgbụ?
    72. Ewu a taa m igu n’isi.
    72. Onye riri oke riri azụ, onye riri azụ riri oke.
    74. Ọkụkọ efughị n’obu, ofuwe n’oke bụ ajọ ihe.
    75. Ọkụkọ sị maamịrị atụrụ esigbuola ya, ya nyụọ nke ya.
    76. Ọkụkọ ghere ma na ọ fọrọ n’olu.
    77. Ọkụkọ tinye ọnụ, o tinye ọkọa.
    78.Oku a kpọrọ nkịta anaghị eme ihere mere nkịta ji emesa ahụ eri nsị.
    78. Ọ bụ abụba ka ọkụkọ jiri buo ibu.
    79. Ọ bụ ezie na nkapịa na-esi isi ma ya na ụmụnna ya yị aga ihe.
    80. Ọhịa ogwu mara ọkụkọ, onye kachie ntị baa na ya, e si ebe ahụ bupụta ozu ya.




    0



    0
  18. 81. Ọkụkọ tupuo ọnụ eruruu ya agbakwala ọsọ.
    82. Onye bụ ịgu ka ewu na-eso.
    83.Ọkụkọ sị mkparị ga adịrịrị ebe ọ bụ na egbuo ya e were isi ya nye ụmụaka.
    84. Ọkụkọ nyụrụ nsị bụ na ogwumagana anọghị ya.
    85. Ọ na abụ dike mịrị mma gbuo ebule ọ were ịṅyịnya machaa mma ya.
    86. Ọ na abụ etowe nwa ewu, ya asọjie ụkwụ. Ọ bụ ire ọma ka ejule ji aga n’ogwu.
    87. Ọkụkọ sị na ihe ya ji mara na ya bụ eze bụ maka na a na ebu ya n’isi eje mba.
    88. Mkpi nkugowe anaghị agba ewu.
    89. Mgbe na mgbe ọkụkọ jiri mara ihe, a gụị ya na Ewu.
    90. Ikegwụ nne ewu ọ rachawa ọkwa.




    0



    0
  19. 91. Ọ naghị abụ ahụchaa ihe gburu ọkụkọ a na asụpịasịkwa ọhịa.
    92. Mụọ gbanụ gbanụ na-eri ewu akpịkpa ntị.
    93. Ọkụkọ anaghị echefu onye kworo ya ọdụdụ n’udummiri.
    94.Ọ na abụ ọkụkọ tuhie egbe e buru ya.
    95. Ọ na abụ atụpụ nkịta akpị ma e zighi ya, ọ dịka a tụrụ ya mbọ.
    96. Mụọ nara nwa ogbenye ehi chọrọ ya ogbugbu.
    97. Ihe atụrụ ji ka ewu ogologo dị ya n’ọdụ.
    98. Ọ na abụ ebini laa azụ ọ bịa ọgụ.
    99. A naghị a jụ nwamkpị ebe ọ lahụrụ ụra; ihe p na ajụ ya ” ị pụtakwara ụra.
    100. Ụmụnne na abọ nya azọ ebini, a ga akpọzi ha nwanne atụrụ?




    0



    0
  20. 101. Ofeke keta ntị ewu n’oke, mmanụ agwụ na ọkụ.
    102. Onye nna ya na-atụrụ adịghị mkpụrụ anya ọbụa ọ na-atụ egwu.
    103. Nwamba anaghị aga ọgụ arịrọ arịọ.
    104. Nwamkpị sị na njepụ amaka; na ya jepụgara wee mụta ịsọkeli isi elu.
    105. Atụrụ sị na ile anya bụ ọrụ na onwe ya.
    106. Onye bụ nwanne awọ zọlata afọ, onye bụ nwanne nkapịa belata ya ọnụ.
    107. Ọnwụ egbuchụghị nwa ewu, aka ga anọrịrị ya n’ikenga.
    108. Otu mmụ nwa, otu mpi atụrụ.
    109. Ọ bụ ụmụnna na-abọ ewu tara ahụ.
    110. Ọ na abụ atụrụ na anyụre ọdụ ya ọ sị na ọ bụ onye nwe ya ka ọ na-emegide.




    0



    0

Leave a Reply

Your email address will not be published.