Zimbabwe:Enyi azọgbuola onye nkirianya

Spread the love

Zimbabwe: Enyi azogbuola nwanyị onye nkirianya (tourist) si Jamani ka ọ na-ese ya foto.

Ozi hoo!haa!! nwetara bụ na ọdachi a dapụtara na Wenezdee a n’ogige Mana Pools National Park, nwanyị nwụzịrị n’ụlọọgwụ ụbọchị ahụkwa.

Nwanyị ahụ gbara iri afọ anọ n’asaa hapụrụ ụgbọala ndi nkirianya ibe ya nọ were kpara n’etiti igwe enyi, ebe ọ na-achọ isete onyonyoo.

Mazị Tibashe Farawo, ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ Zimbabwe Parks and Wildlife Management Authority  kọwara na ụlọọrụ ha achọpụtabeghị ihe kpasuru ụmụanụmanụ ahụ iwe butere mwakpo ha wakporo nwanyị ahụ.

“Mgbe nile, anyị na-adọ ndi nkirianya aka na ntị ka ha nọrọ ote aka n’ebe ụmụ anụọhịa ndi a nọ”

Na mba Afrịka, enyi kacha dị na mpaghara ndida Afrịka (Southern Africa) nakwa mpaghara Ọwụwa anyanwụ (Eastern Africa). Mba ndi nwegasịrị ọnụ ọgụgụ enyi buru ibu gụnyere; Botswana, Zimbabwe, Tanzabịa, Kenya na Zambịa.

Zimbabwe nwere ọnụ ọgụgụ enyi dị puku iri asatọ n’abụọ, narị atọ n’anọ (82,304) nke mere ka ha bụrụ mba nke abụọ nwekasịrị enyi ebe Botswana bụ ndi nke mbụ.

Kwamgbe kwamgbe, enyi na-azọgbu mmadụ na Zimbabwe. Afọ gara aga, enyi zọgbukwara otu onye ndu ndi nkirianya n’ogige Victoria Falls dị n’Ọwụwa Anyanwụ Zimbabwe.

Na Naịjiriya, oke anụmanụ a bụ enyi ka dịgasị na steeti ụfọdụ mana Mgbago Ugwu mana Ndịda dịka Bauchi, Gombe, Kebbi, Osun, Ogun na Cross River.

Ogige Yankarị Games Reserve dị na Bauchi Steeti bụ ebe kacha inwe ọnụ ọgụgụ enyi nwere enyi dị Narị atọ n’iri ise.

N’abalị asatọ nke ọnwa Julayị afọ a, enyi zogburu madụ abụọ tinyere otu nwatakịrị dị afọ asaa n’otu obodo nta didebere Ogige Yankarị ebe ndi obodo na-achọ imetu ụmụanụmanụ ahụ aka ma setakwa ha na ha n’onyonyoo

Leave a Reply

Your email address will not be published.