Legọsị: Asọmmpi GOtvBoxingNight e mere n’abalị ụka n’ama egwuregwu Teslim Elias dị na Surulere, Legọsị kporo ekpo. Taiwo “Esekpọ” Agbaje, ọkaibe otiọkpọ nke asọmmpi ahụ nwetara iko nturugo nke ncheta Mojisola Ogunsanya ya na ihe nrite Otu Nde Naịra n’ọkara so ya n’azụ. Ya bụ otiọkpọ amakebeghi aha ya nọRead More →

Ozi na-eru hoo!haa!! aka gosiri na Alhaji Atiku Abụbaka na-achọ iwere Dọkịnta Ngọzị Okonjọ-Iweala dịka Osote ya na ịzọ ọkwa Onyeisiala n’aha PDP. Nkea bụ maka okwu Sinetọ Devid Mak kwuru n’ọgbakọ ukwu nhọpụta ndi PDP na Pọt Hakọtụ na ọ bụ sọọsọ ya bụ Devid Mak mere onye nwanyịRead More →

E jikwuzi ọtụmọkpọ achụ Onyeisi Sineti Naịjiriya bụ Sinetọ Bukọla Saraki? Ka Sinetọ Dino Melaye abịakwala ọzọ, ya na njakịrị ya na-akpụ ọkụ n’ọnụ? Ihe a bụ ajụjụ ndi mmadụ na-ajụ ụnyahụ n’ọgbakọ Sineti mgbe Dino jiri nkachifu ọcha were hichaa oche Onyeisi Sineti tupu Saraki anọdụ ala were maliteRead More →

Johannesburg: N’ụbọchị Orie bụ abalị isii nke ọnwa Ọktoba ka Ndigbo bi na mba Saụt Afrịka nọrọ n’ogige Observatory Sports Club na Johannesburg were mee mmemme Ịwa Ji nke afọ a. N’ezie, Ịwa Ji Saụt Afrịka nke afọ a kpụ ọkụ n’ọnụ. Ndigbo bi na mpaghara itolu nke mba SaụtRead More →

Otu nwanyị jọrọ oke njọ, Annabelle Jefferson, onye dị afọ iri anọ n’anọ anọrọla na Hollywood,California mba Amerịka kpụpụ nne na nna ya ụlọikpe ka ha kwụọ ya nde dọla abụọ ($2m) maka “ịgba ya ụchụ” Nwanyị a bụ “akpa njọ ” na-ekwu na oke njọ a ọ jọrọ nkeRead More →

Enugwu: Osote Onyeisi Ụlo Nzukọ ukwu Naịjiriya,Ọkammụta Sineto Ike Ekweremadụ, CFR, PhD enyela aka na ịkwụsị mmechi Gọọmentị mba Gana mechiri ụlọahịa ndi Naịjiriya na mpaghara Ashanti, Gana nke ọtụtụ ndi o metụtara bụ Ndigbo. Site n’ozi hoo!haa!! nwetara, Ekweremadụ na Minista mba Gana na-ahụ maka mpaghara Ashanti bụ HonRead More →