Ekweremadụ azọọla ndi ahịa Naịjiriya nọ Gana

Spread the love

Enugwu: Osote Onyeisi Ụlo Nzukọ ukwu Naịjiriya,Ọkammụta Sineto Ike Ekweremadụ, CFR, PhD enyela aka na ịkwụsị mmechi Gọọmentị mba Gana mechiri ụlọahịa ndi Naịjiriya na mpaghara Ashanti, Gana nke ọtụtụ ndi o metụtara bụ Ndigbo.

Site n’ozi hoo!haa!! nwetara, Ekweremadụ na Minista mba Gana na-ahụ maka mpaghara Ashanti bụ Hon Simon Osei-Mensah onye nke bụkwa osote ya mgbe ọ bụ Ọnụnaekwuru ỤlọNzuko otu ECOWAS kpara nkata miri emi banyere nsogbu ahụ ndi be anyị na-enwe na Gana.

N’okwu ya, Ekweremadụ kwuru sị, ” Mụ na nwannem nwoke bụ Hon Simon Osei-Mensah, onye bụ Mịnịsta mpaghara Ashanti ma bụrụkwa osote m n’ụlọ nzuko ECOWAS kpara nkata miri emi banyere ahụhụ ndi be anyị nọ na Gana na-ata maka mmechi e mechiri ụlọ ahịa ha ruru Narị iri anọ na mpaghara ahụ, ọkacha na Kumasi.

“A kọwakwara m ya mkpa ọ dị bụ itinye Mkpebi ECOWAS nile nke metụtara azụmahịa n’enweghi mgbochi ọbụla na mpaghara ECOWAS. O kwere nkwa iji aka ya hụ na e meghekwara ụlọahịa ndi ahụ ozigbo.

Ekweremadụ mekwara ka a mata na ya na Onyeisi otu ndi ahịa mba Naịjiriya bi na Gana bụ Mazị Chukwuemeka Nnaji nọkwa na mkparịta ụka iji hụ na ha na erube isi n’iwu nile nke mba Gana.

O kwukwara na Naịjiriya na Gana eteela ga jiri enwe ezi mmekọrịta dịka ụmụnne nke bụ na okwu ekwesịghị ịna esere ha.

Chetakwa na o teela mba Gana ji akpagbu ndi ahịa ndi Naịjiriya nọ na mba ahụ ka ndi n’enweghị mmadụ.

Nkea mere otu ndi ahịa na Naịjiriya bụ National Association of Nigerian Traders jiri mee ngagharị iwe n’obi otu ECOWAS n’Abụja n’izu ụka a gara aga.

Ngagharị iwe ahụ nke bidoro n’elekere itolu n’ọkara nke ụtụtụ mere ka ụzọ kpọchie n’ogbe Asokoro, Abụja bụ ebe obi ECOWAS dị.

N’okwu ya, Onyeisi ndi otu a n’ala anyị bụ Ọkaiwu Ken Ụkaọnụ kwuru na ha na-enye otu ECOWAS ntimiwu otu izu ụka ịkwụsị mmegbu a na-emegbu ndi otu ha na Gana. Ma ọ bụghị ya, na ha ga alọghachi azụ bịa nochie obi ECOWAS ahụ nile.

hoo!haa!! were na-ajụzị sị, ” Kedu ihe madụ ji isi koro na ịbụ onye Naịjiriya, ọkacha Ndigbo? A chụọ anyị ba Saụt Afrịka, achụọ anyị na Chaịna, a chukwuo anyị na Gana. Gana kwa?

Leave a Reply

Your email address will not be published.