AKPA NJỌ AKPỤKPỤWO NNENANNA YA ỤLỌIKPE

Spread the love

Otu nwanyị jọrọ oke njọ, Annabelle Jefferson, onye dị afọ iri anọ n’anọ anọrọla na Hollywood,California mba Amerịka kpụpụ nne na nna ya ụlọikpe ka ha kwụọ ya nde dọla abụọ ($2m) maka “ịgba ya ụchụ”

Nwanyị a bụ “akpa njọ ” na-ekwu na oke njọ a ọ jọrọ nke si nne na nna ya n’aka ebuteworo ya ịgba alụkwaghịm ugboro ugboro nakwa oke mwute.

“Nne m na nna m jọchara nnukwu njọ, ọ bụ arụrụ ala ha ịfa mụtawa ụmụaka.E kwesịghị ịhapụ ha ka ha mụkwaa ihe yiri ha”

“Gọọmentị kwesịrị iwepụta atụmatụ ime ka ndụ jọrọ oke njọ ghara inwe ike ịtụwa nwanyị ime ma ọ bụkwanụ tụrụ ime”

Aha nna ya bụ Robert Jefferson, dị afọ iri asatọ n’abụọ ebe nne ya bụ Ruby Jefferson, afọ iri asaa n’isii.

N’ịga n’ihu, o kwuru sị, “Di m nke ikpeazụ kpuru isi mana ka a wachara ya anya ọ malite ịhụ ụzọ, ihe mbụ o mere bụ ịgba m alụkwaghịm”

” N’ikpe ịgba alụkwaghịm nke mbụ, di m gwara ọkaikpe na ụtụtụ ọbụla, ọ hụ ihu m agbọ ebiwe ya” o kwukwara n’akwa arịrị.

Ọ sịkwa na ya na-achọ ịmalite otu maka ndi nwere udiri nsogbu ahụ chọrọ ịgba ndi mụrụ ha akwụkwọ.

hoo!haa!! na-akpọkuzi ndi ọbụla jọrọ udiri njọ na-ese okwu ka ha ziga akara ekwentị ha na hoohaa247@gmail.com iji mee ka o ruo nwanyị a aka.

Leave a Reply

Your email address will not be published.