6 Comments

  1. Author

    1. Agụ amụọ ibube ntụ
    2.A na-ebu ụzọ achụpụ anụ akpụ (nkịta ọhịa) tupu ajụwa ọkụkọ ihe mere o ji kpafuo
    3. Mgbakọta nwa enwe bụ n’elu osisi
    4. A gaghị ekwo na agụ karịrị enwe bido kpọwa ụdara nwa enwe ụdara nwa agụ
    5. onye gawara nta gbuo nkịta, ọ hụ agụ ọ ga-egbu
    6. Mkpala ga-ama ọzọ mana ọzọ ga-ala
    7. Nsogbu abụghị ikunye enwe miri, ọ bụ ịnata ya iko
    8. Anụ soro enwe ọ majie aka
    9. onye ọnya ya matara ewi amaghị ahụhụ ndi gwutere ewi n’ọnụ tara
    10. ọsa enwe akwụ, uze enwe akwụ




    0



    0
  2. 1. A ga m eji ụjọ daara enwe n’elu.
    2. Agụ owuru nọ n’ọhịa na-eche ibe ya.
    3. Awọ sị na ọ bụghị ka a ha nọrọ n’ọhịa bụchasị ndị mgba.
    4. Anya edị, ntị edi n’ugbo afa.
    5. A na-ekwu n’ọdụ enwe pere mpe, dinta ewere mma na-egbubirikwa ya.
    6. Anụ ọbụla gbara ọsọ ka oke, nwaologbo arịa ya elu.
    7. A na -egosi nwata awọ n’ikpo okwute, a na-atụrụ ya aka n’ihi na awọ na okwute na -eyiwe onwe ha.
    8. A na-akọrọ nwa ngwere ọ na-ekwe n’isi.
    9. Agụ anaghị amụ nwa ụjọ.
    10. Akwaturu enyi bụ eziokwu , ma ọ kweghị ọbụbọ bụ asị.




    0



    0
  3. 11. Anaghị eji mbe dị ndụ agba afa.
    12. Anụ nwere uche anaghị ekwu okwu ma enyi kwuchie ụzọ.
    13. A na-egbu ngwere gba olu ọtọ , ndị ọzọ aghị amụrụ akọ.
    14. Chi kere agụ agaghị ekwe ka ọ taa ahịhịa.
    15. Dimkpa ọnọkwa n’ụlọ mgbe nne mụrụ awọ ma ghara ị gbatị ya ụkwụ na aka.
    16. Enyi buru ibu elu , buo ibu ala ma ọ naghị ahụ ihe dị ya n’okpuru.
    17. Edi na enwe abụghị otu nne mụrụ ha, ihe siwe ike, enwe na edi azawa nwanne ka ụmụ anụ ndị ozo wee nyere ha efe.
    18. Enwe sị ịhapụ nwa ya aka bụ ma ọ gbara ikpuru.
    19. Ebe nwata na-ebute ozu nchi ka a na-ebute ozu ya.
    20. Ebutere mgbada mgbe a gbagburu ya, olu akaghị ịnọ ya.
    21. Ihe enyi hụrụ gbawa ọsọ ka mbekwu hụrụ wakwawa ọgọdọ.
    22. Mgbada chezọọ onwe ya, akpukpọ ya a gaa koro n’nke dinta.
    23. Mbe sịri na e ruo ebe ya na nwoke ibe ya mere ihe , ahụghị ụfụfụ ahụ ntasị mmee.
    24. Mmiri riri enyi ka mbe na-amakwara ọgọdọ.
    25. Mbe na mbe zụkọọ ahịa, uru anaghị adị ya.
    26. Mbe sị na onye jụ ihe oriri ibe ya erie ya.
    27. Ngwere tụọ ọgụ ya lụọ anụ.
    28. Ngwere nọkarịa n’uju , ọ bụrụ ngwere aghọ.
    29. Ngwere danye n’olulu, ọ mata ndị iro ya.
    30. Nkịta na-achụ ngwere, ogwu na-ama ya n’anya.




    0



    0
  4. 31. Ngwere nwụrụ n’ọba abụghị agụụ gburu ya.
    32. Ngwere agbakaghị ụlọ ọ bụ ya turu.
    33. Nwa enwe sị ihe ya ji ebere bụ , nwa mmadụ ị gbajiri nkụ tụnye n’mmiri ebo ya nwa enwe.
    35. Ngwere nyụchaa nsị , ma ọ nyụnyeghị ya nzu ị mara na ọ bụghị ngwere nyụrụ ya.
    36. Ọ bụghị nwatakịrị nile ka e ji isi ngwere eyi egwu.
    37. Onye atụ gburu nna ya anaghị e ji mpi atụ anụ mmanya.
    38. Ọkụ gbara nnabe bu okpu igwe, ọkụkọ bu ụkwụ ọwara ọ gp-eme ya gịnị?
    39. Ọhụhụ anya mgbada ka ogbugbu ya.
    40. Onye jiri udu fugbuo ewi amaghị n’igwu ala bụ ọrụ.
    41. Ọhịa abụka enyi enwe, ka ajị ruuru ya ọnụ, ọkpachara ya.
    42. O ji akwụ nye nchi ka ọ taa, nchi anaghị arị elu.
    43. Ọbụghị sọ ụtụ bụ nri enwe.
    44. Ugwumagala sị na mgbe ya pụtara ụwa n’ala akabeghị aka , nke a mere ya jị eji ṅwayọ nwayọ azọ ụkwụ n’ala.
    45. Ụdara bụ nke enwe,:anụ ndị ọzọ bịara nche.




    0



    0
  5. 46.Ngwere sị na ihe dị mma na-adị larịị n’anya.
    47. Nkịta na-achọ ọgụ, Edi sọọ ya ọnụ.
    48. Ọ na abụ onye agwọ tara hụ isi ngwere, ya na ọsọ a na-eme.
    49. Ngwere emeghị ihe o jiri bụrụ ngwere , ụmụazị ahụrịa ya n’ọkụ.
    50. Naanị ebe ike na-adị mbe bụ na iri ero.
    51. Enyi daa ntị ga-anụ ya.
    52. Enyi zọọ ọkpa n’ala, ahụ ufuru ọkpa ya.
    53. Mbekwu hụrụ osimiri na-awakwa akwa; ọ ga-awụ awụ ka ọ ga-efe efe?
    54. Anim gwara mbe na ike o ji esiri ya afọ ụfụrụ a gwụla ya.
    55. Ngwere gara pịa eze ọ ga eji taa akụ ma chi fọ; o ruo n’ụtụtụ ọ hụlie naanị nkụvakụ n’ala.
    56. Nkita amaghi obi enwe ; ọ np-achụ enwe n’ala, enwe amagoo elu.
    57. Ụkwu jiw agụ , ya na mgbada abụrụ nwanne.
    58. Ọ nweggị ebe egburu aja ngwere anọghị.
    59. Ngwere nile makpu amakpụ amaghị nke afọ na-asa.
    60. Ọchọ ihe ukwu na-anya agba enyi.




    0



    0
  6. Author

    ỌGBỤGBA OKWE: Uju Nwanekezie 40 (60), Mazị Ikechukwu Ọjị 10 (10). Uju, awọ, nkịta na ngwere abụghị anụ ọhịa




    0



    0

Leave a Reply

Your email address will not be published.