ỊWA JI NDIGBO SAỤT AFRỊKA 2018

Spread the love

Johannesburg: N’ụbọchị Orie bụ abalị isii nke ọnwa Ọktoba ka Ndigbo bi na mba Saụt Afrịka nọrọ n’ogige Observatory Sports Club na Johannesburg were mee mmemme Ịwa Ji nke afọ a.

N’ezie, Ịwa Ji Saụt Afrịka nke afọ a kpụ ọkụ n’ọnụ. Ndigbo bi na mpaghara itolu nke mba Saụt Afrịka bu egwu dị iche iche were bịa ya bụ mmemme.

Onye nnọchiteanya Naịjiriya na mba ahụ bụ Godwin Adekunle Adama bụkwa Onye ọbịa pụrụ iche ụbọchị ahụ. Ichie Jonas Gwangwa, nwa-afọ mba Saụt Afrịka ụwa maara aha ya maka iti egwu Afro Jazz bịakwara ya bụ Ịwa Ji.

Ọzọkwa ndi eze mba ahụ bịakwara dọnyere Ndigbo ukwu nihi ezi mmekọrịta dị n’etiti ha n’Onowu Ndigbo na Saụt Afrịka-Ezealị Ndụbụeze Jonas Udeji(Igurube Okodo II na Nenwe). Ụfọdụ ndi eze ahụ gụnyere HRM Eze Bhugane III nke Embo na HRM Eze Letsisa nke Ba Khlokloe.

E nwekwara ndi ọbịa pụrụ iche si Ala-Igbo bịa ya bụ mmemme. Otu onye n’ime ha bụ HRH Igwe Godwin Okosisi Nwobi, Ugwundu 11 nke Ugwuleshi, Awgu.

Ndi ọbịa pụrụ iche na abịanwughi gụnyere Ichie Nnịa Nwodo(Onyeisi, Ọhaneze Ndigbo), Osodieme Ebele Obianọ(Lọlọ Mbụ Anambara Steeti) nakwa Ugwumba Uche Nwosu ( Onye ji aha APC Gọvanọ n’Imo Steeti).

Ozi juputazịrị ebe nile bụ na ndi IPOB, Saụt Afrịka sịrị na ọ bụ maka egwu ha mere na Ichie Nnịa Nwodo, onye ha si rutere Saụt Afrịka abịaghịzị ya bụ mmemme. Keduzikwanụ maka Osodieme Obianọ nakwa Ugwumba Uche Nwosu? Ndi IPOB e yikwuru ha egwu?

Leave a Reply

Your email address will not be published.