8 Comments

  1. 1. Anaghị agwa onye isi ka nnu ji tụ n’ofe.
    2. Agwa onye isi ka mmanụ ji tụ n’ofe, agaghị agwa ya ka nnu si tụ n’ofe.
    3. Oke ụlọ gwara oke ọhịa na ịkpọkịrịkpọ ogiri dị na ngiga.
    4. Oke ụlọ gwara oke ọhịa na ịkpọ azụ dị na ngịga.
    5. Nwanyị n’eji ogiri esi ofe ma ijiji anya mpịa.




    0



    0
  2. (1) Okirikiri ka-ana agba ukwu ose, anaghị arị ya elu




    0



    0
  3. 6. Nde dị na azụ bụ azụ.
    7. Mmecha ede abụghị ọkụkọ ya.
    8. Ilu bụ mmanụ ndi Igbo ji eri okwu.
    9. Otu aka rụta mmanụ, ozuo ọha ọnụ.
    10. Otu aka rụta mmanụ, ozuo aka ndi ọzọ.
    11. Aka aja aja n’ebute ọnụ mmanụ mmanụ.
    12. Ahịhịa juru n’ọhịa ma abaa achọwa ọkasị.
    13. Ọkwụrụ anaghị amịrị ote ofe.
    14. Ọkwụrụ anaghị aka onye kụrụ ya ogologo.
    15. Ede anaghị agbọ ji.




    0



    0
  4. 1. Okokporo ọbụla jere ebe a na-ekuputa nwa; e fee ya ose n’anya, ajọ ije ụburu ya.
    2. Nwata ọbụla nne ya na-esi ogiri maara ijiji anya kpọrọ.
    3. Ọ bụ nwanyị na-esi ogiri na-ama ijiji anya kpọrọ.
    4. Nwata ọbụla ghọtara ose, aka ya ga-adịrịrị n’ihe agwọrọ agwọ.
    5. Anaghị agwa onye isi na nnu adịghị n’ofe; ihe a na-agwa ya bụ na mmanụ adịghị ya.
    6. Ọnụ ọnye jiri bụ ogiri asọ ka ọ ga-eji rachakwa ogiri.
    7. Akọtọchaa ogiri, a kọrọ ogiri rachaa.
    8. Ose ọcha adịghị mma n’olu opi.
    9. Aka ose adịghị mma n’anya.
    10. Gịnị ka mmadụ ga-enweta n’ike ọkụ , ose ga-eji fugbu ya?
    11. A nyụọ ahụrụ ma osighị isi, a ga-aracha ogiri?




    0



    0
  5. 12. Onye tara ose, anya anaghị adị ya mma.
    13. Onye ka e tinyere nnu n’ọnụ, ọ gbụpụ?
    14. Anaghị atụ oke ogiri n’ahịa.
    15. Epeghị m mpe agọ agụgọ; ejighị m ngu aghọ ose.
    16. Etere ụgba; etere azụ; ogiri bụ ọgwụ ofe.
    17. Ijiji so ogiri bịa ahịa; nke a , o sokwanụ onye bịa?
    18. Obodo ọbụla zụtara nnu turu osimiri amarawo nne mụrụ Chukwu.
    19. Anaghị eji otu okpoko ụtara ama ofe nnu tụrụ.




    0



    0
  6. 20. Ọkụkọ sị na ihe na ewe ya iwe bụ na ndị mmadụ ga ahapụ akpala ya, were ego gaa ahịa ga zụrụ ogiri.




    0



    0
  7. Author

    ỌGBỤGBA OKWE: UJU NWANEKEZIE 17, DỌKỊNTA ACHỤKỌ 12, CHIDERA UNAMBA 1




    0



    0
    1. Condiments bụ spice e ji esi nri; ọbụghị nri ma ọ bụ ihe e ji ndị e ji esi nri.
      E kee oke n’aka a mara ndị a kpọrọ asị.
      Ọbaghị uru mmadụ ịbịa na-atufu data ya ma ọ bụ oge ya ebe a.
      Ngafe ka m na-agafe.

      Dalụnu ooo.




      0



      0

Leave a Reply

Your email address will not be published.