12 Comments

  1. 1. Nkata ga-ekpudo onye aghụghọ.

    0

    0
  2. 1. atụọ ilu nkirika nkata onye tara ahu amara onwe ya
    2. asọkata eze anya ekpuru nkata na ihu gwa ya okwu
    3 ọhia na asọ nkata ya epụla ero

    0

    0
  3. 1. atụọ ilu nkirika nkata onye tara ahu amara onwe ya
    2. asọkata eze anya ekpuru nkata na ihu gwa ya okwu
    3 ọhia na asọ nkata ya epụla ero
    4. elelia nwa ite ogbọnyụọ ọkụ

    0

    0
  4. 5 onye bu mmadu uzọ shiwe ite, ka ya enwe ṅkpọkọrọ ite
    6 agụ owụ si kama isi ya ga agbọ na ite dinta, ka ọchi chia ụzọ ha siri gba ọsọ

    0

    0
  5. 1. Nri agbọtara na akụkụ ite na-ala na akụkụ ọnụ.
    2. Ọkụkụ hapụrụ nma gburu ya ewere ite iwe

    0

    0
  6. 3. Onye na amaghị ụzọ iyi, ya sowe mpempe ite

    0

    0
  7. 4. Elelia nwa ite, ya agbonyuo oku

    5. Ite ọhụrụ g’emechaa hụ ihe ite ochie hụrụ.
    6. Ọkụkọ n’ewere ite iwe, chefuo mma gburu ya.
    7. Onye na-amaghị ụzọ iyi, ya sowe mpekere/mpempe ite.
    8. Mkpi abụọ n’añụ mmiri n’otu ite ga-asọkọta mpi.
    9. Azụ ọkpọ gwuru mmiri ukwu, gwukwaa mmiri nta, ṅma lagbuo n’ite ofe.

    10. Nshịkọ sị na ya gwuru iyi ukwu, gwukwaa iyi nta, ma ite ofe agadị nwanyị sụkpọrọ ya anya.
    11. Isi ehi anaghị agbọ n’ite.
    12. Obere ite n’agbọ n’ọkụ ngwangwa/ọsịsọ.
    13. Ihe dị mkpa n’aga n’ime ite.
    14. Ite kacha mma anaghị amịta nri.
    15. Nanị nnụnụ ọnụ ogologo na-añụ mmiri n’ite.
    16. Ite n’esi nri, efere na-anara ekele.
    17. Ọkpụ ite n’eji mpempe/mpekere ite eri nri.
    18. Ite n’enwere ọnọdụ n’elu ọkụ.

    19. Nwa ewu tiwara ite nọ na nsogbu.

    20. Ọbụghị mkpọkọrọ ite kowere onwe ya.

    21. Ọ bụ aka mere ite, ite jiri mee kpokororom.

    22. Onye m biara be ya sibe ite egheghị eghe, mụ aghọọ ọbịa ala ala.

    23. Ndi ite esoghị ndi ahia.

    24. Onweghị ihe okụ ga-eme ite ọla.

    25. Kama ite m sinyere n’ọkụ agaghị eghe eghe, nkụ m kpatara n’ọhia ga-agwụ.

    26. Okokporo na-ete nkwụ na-esi ite, ma nkwụ ya echughị, ite ya echue.

    27. Erichaa nri ma asaghị ite, ite agbaa ama ihe eriri.

    28. Nwa oke asaghị anya kwụrụ okwuchi ite mmanụ, mgbe ọ ga-eto, o buru ite mmanụ.

    29. Ọkụkọ hapụrụ mma gburu ya ga tụgọbara ite ofe onu.

    30. Anaghị ama ọkụkọ ọcha n’ite ofe.

    31. Esinye ite anụ ụzọ nabọ njem nje egbue nwa nkịta.
    32. Mpekere ite arụghị ihe ọzọ ọrụa ngụta ọkụ.
    33. Onye bu ite mmiri anaghị agba ọsọ.
    34. Ọ bụ mata ghara ka ọkụ ji hapụ ite gbue ihe dị n’ime ya.

    35. Ọkụkụ ntị ike na-anụ ihe n’ite ofe.

    36. Okenye ji anya eke nri dị n’ite.

    37. Ama ka ite adịna oji ma ya sie nri di ọcha.

    38. Eku na-eje be ite mana ite anaghị eje be eku.

    39. Onye rijuru afọ tiwaa ite, o chere na agụụ agaghị agụ ya echi?

    40. Enweghị nnu, enweghị ose anaghị anapụ onye butere ite mmanya ịracha aka.

    41. Onye mgbọ tụrụ nna ya n’isi na-eji ite ọla akwa okpu.

    42. Okwute ria elu, egwu atụwa ite mmiri.

    43. Anaghị atụnye okwute n’ebe adọwara ite mmanụ.

    44. Ama ana-agbara onye chọrọ idebe ite bụ ‘lekwa okwute’.

    45. Nkpụrụ akwụ dabara n’ite mmanụ sị ka ahapụ ịchọ ya n’ihi na ya alaruela be nna ya.

    46. Ihe anyị hụrụ n’ite abụzịghị ofe.

    47. Ọ bụ onye bu nkata ụtara na-achọga onye bu ite ofe.

    48. Mpoto mpoto na-asụ n’ite.

    49. Ite ọkụ bata n’ọba, egwu atụwa mkpụrụ ji.

    50. Esinye ite nri n’ọkụ ụjọ ejide agụụ.

    51. Onye nrịtụ nri anaghị ahụ ike ite.

    52. Etoo aka kpụrụ ọkụ (ochiri), ọ kpụọ ite.

    53. Nwata riri ihe bukarịrị isi ya ibù gini ọzọ ka ọ na-achọ n’ite?

    0

    0
  8. 4. Elelia nwa ite, ya agbonyuo oku

    54. Nkata bara mmiri, jiri ya kuru mmiri

    0

    0
  9. 55. Akpara nkwo kpara nkwo, ewere nkata jee oburu oshi.

    0

    0
  10. 2. Anaghị ama uru nkịrịka nkata bara ruo mgbe a ga-ebufu aja.
    3.:Arụ ite anaghị aka arụ mmiri.
    4. Ite mmanya ga -esere enyi na enyi, ya kụwaa n’ụzọ.
    5. Agadị nwanyị daa ada ugboro abụọ, a gụọ ihe o bu n’nkata ọnụ.
    6. Onye buru ibe ya ụzọ siwe ite na-aka ya enwe nkpọnkpọ ite na nkpọnkpọ aya.
    7. Oke ọkwa kpudoro oke ite dị ọkụ, ya na ọsụsọ na-eme.
    8. Ọkụ ero bụ nwa nkata.
    9. Onugbo ga-emechaa hụ ihe ụrị hụrụ n’ime ite ofe.
    10. Ọkụkọ ntị ike na-anụ ihe n’ite ofe.

    0

    0
  11. 11. A tụọ ilu nkrịka nkata, agadị nwanyị eleghasịa onwe ya anya.
    12. Nshịkọ gwuru mmiri ukwu gwuo mmiri nta,ma naanị ite ofe agadị nwanyị agbagbuo ya.
    13. Ihe ọ sọrọ otoro ya gbaa nne ehi, anụ ya ga-ejuriri nkata.
    14. Ọ na abụ nnukwu ite siri n’ọkụ, umu ogbenye agaburu onwe na ozi.
    15. Isi anụ anaghị efu efu n’ite ofe.
    16. Nkata kara nka ga-ala ama iyi.
    17. Ọ na abụ ewu tiwaa ite, ọ nyara akịrịkọ eju n’olụ.
    18.

    0

    0
  12. ỌGBỤGBA OKWE: DỌKỊNTA ACHỤKỌ 52 (55), UJU NWANEKEZIE 14(17), NNAEMEKA IBE 6 (6)

    0

    0

Leave a Reply

Your email address will not be published.