Ọ ATIKU N’OKONJỌ-IWEALA?

Spread the love

Ozi na-eru hoo!haa!! aka gosiri na Alhaji Atiku Abụbaka na-achọ iwere Dọkịnta Ngọzị Okonjọ-Iweala dịka Osote ya na ịzọ ọkwa Onyeisiala n’aha PDP.

Nkea bụ maka okwu Sinetọ Devid Mak kwuru n’ọgbakọ ukwu nhọpụta ndi PDP na Pọt Hakọtụ na ọ bụ sọọsọ ya bụ Devid Mak mere onye nwanyị Onye Nchịkọta Otu Achụmnta Nkwado ya n’ihi nkwenye ya na ụmụnwanyị kwesịrị iso n’ihe a na-eme.

N’aka nke ọzọ, na Okonjọ-Iweala bụ onye Delta Steeti, mpaghara Ndịda Ndịda(South South) a na-alụ n’Abịa Steeti, mpaghara Ọwụwa Anyanwụ (South East) ga-eme ka o nwee nkwado mpaghara abụọ ndia.

Kaosiladị, ihe ka ji Atiku ikpebi onye ga-abụ osote ya bụ maka nnukwu ịzụ okwe ndọrọ ndọrọ ọchịchị na-aga n’ihu ugbua n’etiti Ndigbo na ndi Yoroba maka ọkwa ahụ.

N’agbanyehi na PDP wegara ọkwa a mpaghara Ọwụwa Anyanwụ, ndi Yoroba na-esi ọnwụ ka e nye ha ọkwa ahụ iji tie ha aka n’obi maka nnapụ a napụrụ ha ọkwa onyeisioche otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị ahụ nke e kenyeburu ha.

Akinwumi Ayọdeji Adesịna, onye bụ onyeisi ụlọakụ African Development Bank (AfDB) ma bụrụkwa onye jibu ọkwa dịka Mịnista na-ahụ maka Ọrụ ugbo na Naịjịriya ka a na-akpọsị aha ya ike na mpaghara Ọdịda Anyanwụ maka ọkwa ahụ.

Nke ka nke bụ na Buharị chọzịrị ijizi onye Igbo were nọchie osote ya bụ Yemi Osinbajọ ma ọ bụrụ na Atiku eweta onye Igbo dịka osote ya iji mee ka Ndigbo kwenye na ya bụ Buharị ga-enyefe ha ọchịchị n’aka n’afọ 2023.

N’ihi nkea, Atiku Abụbaka, onye ji aha PDP azọ ọkwa onyeisiala nwere ike hapụ ịkpọpụta onye ga-abụ osote ya ruo oge ikpeazụ.

Anyị nụkwara na Okonjọ-Iweala ịbụ onye a ga akpọlite na-enye Ọbasanjọ obi ụtọ pụrụ iche nke mere o jiri kwuo na onyeisiala Naịjịriya chọrọ ugbua bụ onye mara nke ekwe na-akụ banyere okwu akụnụba obodo iji mezie ihe ọchịchị nọ ugbua mebigasịrị.

Ụwa nile mara oke Ada Igbo a dịka ọkaibe n’okwu akụnba obodo ma bụrụkwa onye mere na otu akụnụba mba ụwa dị iche iche kagburu ụgwọ nile Naịjiriya ji oge ọ bụ Mịnịsta na-ahụ maka Akụnụba n’ọchịchị Ọbasanjọ.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published.