18 Comments

  1. 1. Isi ehi anaghị agbọ n’ite.
    2. Ihe na esi nkapị isi dị ya n’ahụ.




    0



    0
  2. 3. Isi buru ibu anaghị ezenwu ọkpọ




    0



    0
  3. 1. Onye otu anya na abu eze na-ala ndi isi




    0



    0
  4. 4.N’isi n’isi ha bụ n’ọnụ

    5.Tuu bụ isi opi

    6.Isi kote ebu, ọ gbaa ya

    7.Isi mkpi nọ n’akpa mkpi

    8.Isi akwa adịghịzị n’ebe e zochiri ya

    9.Onye na-enyo, isi ya a na-apụta

    10.Uka a kpara akpa, eji isi ekwe ya

    11. Isi nwa-eze anaghị efu na mba

    12.Isi akwu dara n’ala emetula aja.

    13. isi mkpi di na akpa mkpi

    14. Isi kara aka na-ebu ogidi

    15. Ngwere isi kara aka na-eje ọgụ agbịrịgba




    0



    0
  5. 16. Agwawa ntị ma ya anụghị,egbuwe isi egburu ntị

    17. Agbakata Eze nkịtị, ekpuru nkata/ekete n’isi gwa ya okwu.

    18. Ka ahụ n’anya ka mgbọ jiri tụọ Enwe n’isi.

    19. Nwata ụkwụ njenje ka okenye isi awọ ihe mara

    20. Atụọla ọmara ya amara, atụọla ofege ya efenye isi n’ọhịa.

    21. Ahapụ otule nyuru ahụrụ,akụọ isi ọkpọ

    22. Ọbụrụ na ịtaa m arụ n’ike ịsọghị nshị, mụ ataa gị arụ n’isi agaghịm asọ ntutu isi

    23. Isi na isi ha bụ n’ọnụ, ma mmadu ka ibe ya

    24. Onye tụọ Chukwu okwute, ọzewe isi ya

    25. Isi buru ibu anaghị ezenwu ọkpọ

    26. Isi Ehi anaghị agbọ n’ite

    27. Nma dị nkọ, anaghị enwe ezigbo isi

    28. Udele sị na ọnweghị ihe jikọrọ ya na ọkpụ isi

    29. Isi waba nkịta ara, ọmajijiji amawa ụjọ

    30. Mụ ga akụtara gị isi abaghị okpu




    0



    0
  6. 31. Nsi anaghi ano n’afo esi isi.




    0



    0
  7. 32. Onwu g’egbu nwa nkita, onaghi ekwe ya nu isi nsi.
    33. Ana esi na isi ahuru amara uto nsi




    0



    0
  8. 1. Mma dị nkọ enweghị isi nke nwere isi adịghị nkọ
    2. Ngwere isi kara aka na-eje ọgụ agbịrịgba
    3. Isi kara aka na-ebu ogidi
    4. Isi ala anaghị atọ n’ebe a kpọrọ ya
    5. Anaghị achọ isi anụ achọ n’ite ofe
    6. Ụka a kpara akpa, e ji isi ekwe ya
    7. Isi amadụ ( amadị ) anaghị aka nke ibe ya
    8. Ahụ dike na-eme ọgụ e metụrụ ya aka n’isi mma
    9. Ebe ọbụla isi si ma ya ruo ụlọ
    10. Isi nne ehi daa, ọkụka (ogige ehi) e chie
    11. Ozu siwe isi nwanne e buru
    12. Isi na-esi nkakwụ si ya n’ọkpụkpụ
    13. Onye rachachaa ụdara ọ zọtara n’ụkwụ, ọ ga-azọtakwa ọzọ
    14. E nweghi ihe e mere ka onye isi hapụ ịla n’abalị
    15. Nwa atụrụ na-achọ ịsọ mpi ekwo kaa ya aka




    0



    0
  9. 34. Agba nsi nkiti o n’esi isi
    35. Onye no mmadu nso na-anu isi onu ya
    36. Eju kpuru onwe ya isi, ghoro onwe ya nri.
    38. Ana agwa onye isi na mmanu di na oge ma anaghi agwa onye isi ka nnu si tuo n’ofe.




    0



    0
  10. 1. Miri si n’isi gbaruo
    2.uru adighi n’isi azu
    3. Utara na-enwe isi enwe odu
    4. Isi mkpi di n’akpa mkpi,
    5. O nweghi onye ma ebe agwo abali dewere isi
    6. Isi biara ahia okpu bia ahia
    7.




    0



    0
  11. 1. Isi akwụ dara n’ala edetụla aja.
    2. Onye nọ mmadụ nso na-anụ isi eze ya.
    3. Ịjụta isi nkita, Ị ga-eji agba ya mee gịnị.
    4.Anaghị ahapụ isi aka agba ụrịọm.
    5. Ihe onye metara, ọ were isi ya buru.
    6. A kọruoro nwa ngwere, ọ kwe n’isi.
    7. Ewu rie ji ngwere na-ekwe n’isi, ewu erighi ji, ngwere na-ekwe n’isi.
    8. Ihe eji ebere onye ibi akwa bụ, ebe o dị nọ n’nkpa, mana ọ kaghị ihe isi na-ebu.
    9. I bo mpọtọ ede ibu karịrị ya, ọ chịeị isi.
    10. Ị chọwa anya anụ ị gaa n’isi ya.




    0



    0
  12. 11. Kama egbw ga-ahapụ nwa ọkụkọ, isi ya atọ na-akịrịka.
    12. Mgbe a ga-ala isi, e mee laa afụ ọnụ.
    13. Mmadụ agaghị ekworo na ụganị dị wee sị n’isi ede dị ka isi nne ya.
    14. Nwanze na-eze isi ya maka echi.
    15. Nkakwụ dị ndụ na-esi isi, ọ nwụọ ọ ga-esi aghaa?
    16. Nwanyi buru ụzọ daa isi mkpe na-erere ibe ya ihe.
    17. Onye na-enyo, isi ya a na-apụta.
    18. Onye ụlọ egbughị onye, isi ga-acha ya awọ.
    19. Ọkụkọ sị na ndị nwere isi ka ọgụ isi dịrị.
    20. Ọbụrụ n’isi nwoke adaghị n’ala, o koro n’elu.
    21. Ọ bụ eziokwu na nkapịa na-esi isi, ma na ya na ụmụnna ya so aga ihe.
    22. Oke osisi bụ onye na-egbu, ọ na-eze isi ya.
    23. Ụtụ onye esoghị atụ na-adị ka ọ bụ sị tụọ isi mmadụ.




    0



    0
  13. 24. A kpụrụ mkpi, a kpụrụ isi ya.
    25. Eje ala bụ isi ije.
    26. Isi na isị ha bụ okwu ọnụ, mmadụ na-aka ibe ya.
    27. Ọ na abụ e buru ihe ka egbe n’isi, egbe a dị nfe.
    28. Onye isi sị sị gwa ya onye nwụrụ nke ọma ka ọ wee ghara ịbe akwa onye dị ndụ.
    29. Isi naabọ na=egbu Dike.
    30. Ejula kpụrụ isi wọrọ onwe ya nri.
    31. Nkịta anaghị eri nsị dị ya n’isi.
    32. Ọchọ ihe dị anya isi kpatara ọchọ Egbe ji achọ ya na ngịga.
    33. Ọ na abụ isi awọ chọọ okenye ma ọ hụghịị, ọ chaa ụmụazị.
    34. Ọ na abụ eburu ozu onye ọzọ n’isi, ọ dịka ebu ukwu nkụ.
    35. Onye ije ka onye isi awọ ihe ama.
    36. Onye isi ike na-ebi n’ala kpọrọ nkụ.
    37. Ọ na abụ onye agwọ tara hụ isi ngwere, ya na ọsọ a na-eme.




    0



    0
  14. 38. Ụka akpata akpa, isi ka eji ekwe ya.
    39. Onye isi nkwọcha anaghị eje nzukọ ọkụ.
    40. Ọ na abụ ozu sebe isụ, enyi ka nwanne a laa.




    0



    0
  15. 41. Ọ na abụ udude kụchichaa, ọ were isi nwa ya kughesịa.
    42. Ibi ahaghị ka ihe nwoke na-ebu n’isi kama ebe ọ dị dị njọ.
    43. A naghị m aga ọgụ ; ma ahụla m isi ndị e gburu egbu.
    44. Onye na-agba nkịta amu na-ejide ya n’isi.
    45. Ikwii kwii sị na isi nwa ya na-atụ ya egwu ma ọ bụ ya mụrụ ya.




    0



    0
  16. 45. E buru ozu gagharịba k’esi mara ya, ozu erekaa n’isi.
    46. Isi baa uru, ọ bara agụba.
    47. Ururu sị kama isi yaxga-akwụ anwụrụ ọkụ, na ọ ka mma na ọchị chịrị n’ụzọ ya na dinta siri gbaa ọsọ.
    48. Ọkọọkpa naabọ anaggị anọchi n’ụsi nkpọ ọkụkọ.
    49.




    0



    0
  17. 49.Ka e ji nwamkpi wee maa atụ, asi egbe buru isi nne ya?
    50. Ọ bụ ka enyotachaa ka mgbọ ji tụọ enwe n’isi.
    51. Kama m ka ekwu isi mkpụmkụ pụm; isi ajọka.




    0



    0
  18. 52. Onye isi dube onye isi; ha abụọ adanye n’olulu.
    53. Onye otu mkpụrụ anya ji isi ụgwọ.
    54. Ọnwụ ọbụla ga-egbu nw nkịta anaghị ekwe ya anụ isi nsị.
    55. Ọ naghị abụ ahụchaa isi ji , a maa mbazụ n’ala nkịtị.




    0



    0

Leave a Reply

Your email address will not be published.