20 Comments

  1. 1. Onye nna ya ziri ohi na-eji ụkwụ agbawa ibo.
    2. Ụkwụ ọkụkọ zọrọ nwa ya apụghị igbu ya.
    3. Ugwu mụta ịgbaji ukwu; agadị nwanyị amụta ọ gakata ozuo ike.




    0



    0
  2. 1. Anaghi eji amu ukwu eyi akwula egwu
    2. Anaghi eji ukwu abuo ele omimi mmiri




    0



    0
  3. E ji ụkwụ achọ ịhe danyere na mmiri?




    0



    0
  4. 4. Agbasịa egwu, ọ la n’ukwu.
    5. Abụzụ otu ụkwụ na-agba na mbụ ebịdo. Anaghị anọ n’ukwu ụkwa aghọta ube, ị mee etu ahụ ụkwa adagbuo gị.
    6. Dimkpa ọ nọkwa n’ụlọ mgbe nne mụrụ awọ ma ọ ụgbatịghị ya ụkwa na aka.
    7. Eleghị anya wee wụda bụ iwuji ụkwụ.
    8. Ụkwụ na-aga wara wara, anya na-aga wara wara na-ahụ ya.
    9. Ụkwụ jie agụ, mgbada abịara ya ụgwọ.
    10. E buru ozu onye ọzọ , ọ dị ka ebu ukwu nkụ.




    0



    0
  5. Nwanne awọ gbatịa ya ụkwụ ka nwanne nkapị bebilata ya




    0



    0
  6. 3) E sowe utọ agbọnọ, a rahụ n’ukwu ụdara




    0



    0
  7. 4) Mgbada nyụọ ka enyi, ukwu awaa ya




    0



    0
  8. 11. Ụkwụ kpọrọ ịzaga na-enyere ya aka n’ije.
    12. Ụkwụ ka eji achọ ihe dara mmiri.
    13. Ọgba ka etoo ya aghaghị iwụji ụkwụ.
    14. Afọ ekweghị ụkwụ zuo ike.
    15. Ọ na abụ etowe nwa ewu , ya asọjie ụkwụ.




    0



    0
  9. 16. Okirikiri ka a na-agba ukwu ose anaghị arị ya elu.
    17. Nkịta sị na ihe o ji anọdebe onye afọ ukwu bụ ọ nyụghị anyụ, ọ gbọọ agbọọ.
    18. Onye ga-ahụ hụsịkwaa ; n’ihi na ukwu ube anaghị anya akpa.
    19. Ọchọ ihe ukwu ga-anya agba enyi.
    20. Ụkwụ jie agụ, ya na mgbada abụrụ nwanne.




    0



    0
  10. 21. Ukwu nkụ a haghị ka ihe tanara n’ọhịa.
    22. Nshịkọ gwara aka na ụkwụ ya sị, ” ihe ọbụla unu kotere, unu eburu.”
    23. Onye ketara ukwu onye amụ ibi n’oke ji anụ.
    24. Onye ọbụla gbara awọ ụkwụ mere ka ije dịrị ya mfe.
    25. Nshịkọ gwuru mmiri ukwu, gwuo mmiri nta, ma naanị ite ofe agsdị nwanyị agbagbuo ya.




    0



    0
  11. 3. A naghi e ji ukwu abuo ehe ogwe

    4. Ihe dabara n’mmiri, ukwu ka eji a cho ya

    5. Ukwu jie agu mgbada a biara ya ugwo

    6. Ukwu na-ga wara wara, anya na-ahu zam zam na-ele ya

    7. Anya rue ma ukwu erula

    8. A chuwa agbo oma nke ojo gbagide oso o da jie ukwu.

    9. afọ ekweghi ụkwụ zue ịke

    10. ana ekwu n’ọkụkọ amanye ọnụ, ọ chiri ukwụ abuọ wụnye

    11. mmiri aṅaghi eri onye ọhughi ukwu ya

    12. agwọ enweghi ụkwu ma ọ na ari elu

    13. ọna aka mma ikwọ mmiri mgbe ọ ka nọ na ọba ukwu

    14. onye isị tufue udara ọzọtara na ukwụ, onye ga enye ya ọzọ?

    15.:ejighi ukwụ abụọ ele omimi mmiri




    0



    0
  12. 16. Ụkwu na-aga warawara, anya n’ele zamzam n’ele ya.

    17. Ka ụkwụ ha nwanyị,ya tụkwasị ya di ya

    18. Ugwu mụta mgbaji ụkwụ, agadị nwanyị amụta agakata ezughị ike

    19. Ukwu jie agu mgbada abiara ya ugwo

    20. Ukwu ka eji acho ihe dabara mmiri

    21. Etu ukwu efi si azo nala abughi ka okpa ya si azo

    22. ukwu gbachaa oso m’obu gbachaa egwu o naa n’ukwu

    23. Asaba ikpere ukwu ka osi eji oji i mara na mmiri di n’ulo ga agwu

    24. Ukwu bu aru

    25. Ukwu na aga warawara anya na aga warawara n’ahu ya

    26. Ukwu na aga adighi akpo ukwu…ogwu amaghi ya, boturu amaa ya

    27. Nwata ụkwụ njenje ka okenye isi awọ ihe mara

    28. Mbe sị n’agha daa ya azọgbuo nwanyị dị ime, agha adaa ndị nwere ụkwụ azọgbuo nwanyị dị ime, ejide mbe kpọshie

    29. Anaghị eji ụkwụ abụọ elele omimi mmiri




    0



    0
  13. 30. Azu okpo gwuru mmiri ukwu, gwuo mmiri nta ma lagbuo na ite ofe agadi nwanyi.
    31. Onye huru ka okuku na abo nsi, ya chuo ya maka onweghi onye ma onye ga ata ukwu ya.




    0



    0
  14. 32. Elebe ukwu egbuo ewu.
    33. Oshimiri anaghi eri onye o na ahughi ukwu ya anya.




    0



    0
  15. 26. Nwanyị ike ukwu ọ na-atụ egwu; ọ bụghị mmadụ ga-alụ ya.
    27. Onye ketara ụkwụ mgbada n’oke ejighị anụ.
    28. Anaghị ere ọkụkọ ụkwụ jiri n”ụlọ.
    29. Arịrị azọrọ ụkwụ ekwughị okwu, onye zogburu ya gaa na-ehicha ụkwụ ya n’ahịhịa.
    30. Ihe ọmasịrị gị mere onye ụkwụ nge, ọ gbakụta gị azụ ọ bọrọ gị ike.
    31. Ọ na abụ ite ukwu siri n’ọkụ, ụmụ ogbenye agagburu onwe ha n’ozi.
    32. Agwọ sịrị na ihe ya ejighị nwe aka na ụkwụ bụ maka na ọbụrụ na ụkwụ ya ekotaghịrị ya okwu, aka ya ga-ekotarịrị.
    33. Mmiri na-amachi ije ụkwụ ma ọ naghị amachi okwu ọnụ.
    34. Ụkpaka anaghị agba nso n’ukwu ya.
    35. Ugiri anaghị ada n’ukwu ugiri.
    36. Ọ bụ onye osimiri hụrụ ụkwụ ya ka ọ na-eri.
    37. Nshịkọ sịrị na mgbe ọbụla egwuregwu ruru n’ichife aka azụ, na aka ya na ụkwụ ya adịghị ya.
    38. Anaghị anọ n’ụlọ ebute mgbada ụkwụ jiri.
    39. Onye na-eche ọbịbịa enyi ya nwanyị na-anụ nzọ ụkwụ ndị mmụọ.
    40. Ọ na abụ mmadụ tinye ụkwụ ya n’ụkwụ ekperima, ọ bụrụ onye ohi.
    41. Oke nkịta sị na ihe o ji abụ ya chọọ ịnyụ maamịrị ya e welie otu ụkwụ ya elu bụ ka ọ gọrọ ụmụnna yacagụgọ amụ ibi.
    42. Onye ihe mere ebughị ụzọ egwu, onye ka ụkwụ ya ga-apụ n’ọgbọ?
    43. Onye nwụọ were aka ya gbuo onwe ya, ọbụrụ na ụkwụ ya apụtaghị, aka ya ga-apụtarịrị.
    44. Ike gwụ ụkwụ, agụụ echere ya aka mgba.
    45. Ụkwa dara ụbọchị mmemme eweliteghị ụkwụ.
    46. Nwoke ọbụla ya na nwunye ya na-alụ ọgụ ya na-agba ya ụkwụ n’ike; ihe ọ na-eri ka ọ na-ekponye aja.
    47. Ọkwo m n’azụcma ụkwụ m na-akpụ n’ala, hapụ m ka m were ụkwụ m gawa.
    48. Iwe egwu anaghị ewe onye ụkwụ ya n’agbajighị agbaji.
    49. Ịkọ ụkwụ na okwute bụrụ chiọma, ya akpọla m.
    50. Mmụọ ejiri akwa ọkụkọ chụrụ aja kwesịrị ịma na ụkwụ na aka ọkụkọ ahụ dị na ya.




    0



    0
  16. 51. Buru rịkodo bụ anya ukwu.
    52. Ọ na abụ anụ jewe ka enwe, ọ majie ụkwụ.
    53. Onye ụkwụ adịghịị kwesịrị ịma ụzọ ụka.
    54. Ngwere gbawa ọsọ hapụ ukwu osisi, nkịta ejideghị ya, aka ọzọ akpara ya.
    55. Ọ na abụ ọkọ kọwa anụmanụ, ọ jee n’ukwu osisi; ọ kọwa mmadi, o jekwuru nwanne ya ka ọ kọọ ya.
    56. Ụkwụ na anaggị elo onye nọ ṅa be ya eche mmadụ.
    57.Mba ama onye ukwu.
    58. Ọ dị mma ịnọ n’ukwu akị ilu gwa ya na ọ na-elu ilu kama, ọ chọzighii ịda ya hapụ.




    0



    0
  17. 59. Ụkwụ gafere iyi ga-alaghachi; ma okwu gafere iyi apụghị ịlaghachi azụ.
    60. O ji aka apị, ya pịta obi aja; o ji ụkwụ apị, ya pịtakwuo obi aja.




    0



    0
  18. 61. Onye otu ụkwụ anaghị aza akwaa akwụrụ.
    62. Onye bioro nsị nkịta zọrọ nsị naabọ ụkwụ.
    63. Ọgụ karịa ndị gbajiri aka, ndị gbajiri ụkwụ asị ndị gbajiri aka ndo.




    0



    0
  19. Author

    “1.Anaghi eji amu ukwu eyi akwula egwu”. Dọkịnta Achụkọ, hoo!haa!! achọghị udiri ilu a. Ndigbo na-amacha aha ihe ma kpọọ ya ihea. Ilu nke a furu efu

    ỌGBỤGBA OKWE:UJU NWANEKEZIE 63(63), DỌKỊNTA ACHỤKỌ 29 (33), CHINENYE NNỤBỊA 4 (4).
    UJU NWANEKEZIE eturukwala ugo mana dịka anyị si emere ndi ọhụrụ anyị na-arịọ UJU ka ọ hapụrụ CHINENYE bụ onye ọhụrụ ihe nrite Narị Naịra Anọ ya ebe ọ ga ewezi nke onye abụọ, Dọkịnta ewerezia nke onye nke atọ




    0



    0

Leave a Reply

Your email address will not be published.