NNAMDỊ KANỤ O JI ỌGWU?

Spread the love

Nnamdị Kanụ, o ji ọgwụ?“. Ihea bụ ajụjụ ọtutụ na-ajụ kemgbe Mazị Nnamdị Kanụ,  onyeisi otu na-achọ nnwere onwe Bịafra bụ IPOB gbakwara n’ọgbọ ọzọ.

Kemgbe ndi agha “Egwu Eke” wakpochara obi nna ya bụ Eze Izrel Kanụ n’Afaraukwu, Ụmụahịa n’ọnwa Septemba afọ gara aga wee gbuo ndi IPOB madụ iri abụọ n’asatọ.

Ọtụtụ amaghị ma ya bụ odogwu ọ dị ndụ ka ọ nwụrụ na mwakpọ ahụ.  Iji gosi udiri ebube na-eso nwoke a, madụ nile chọrọ ịma ihe ọ ga-ekwu n’ozi ya n’ụbọchị ụka gara aga, ma ndi enyi ya, ma ndi iro ya.

N’Ajegunle, Legọsị, ndi mmadụ gbakọrọ chinye ntị na redio iji gere ozi ya.

Ndi mmadụ na-ajụ, nwoke a, o ji ọgwụ? O nwere onyinye pụrụ iche Chukwu nyere ya? Ka o ji maka agụụ nnwere onwe na-agụ Ndigbo were na-erizi ndi be anyị?

Ụfọdụ na-ekele Chukwu na “Nwa Chineke” awụchaala n’ọgbọ. Ha nwekwara olileanya, dịka o siri gwa ha na Bịafra adịwo nso.

Ndi dị otu a hụtara Mazị Kanụ dịka onye amụma nakwa onye nzọpụta. N’ihi ya, ha anaghị eji okwu ọbụla si ya n’ọnụ egwu egwu. Ntuziaka o nyere bụ ka ndi “Bịafra” ghara isonye na nhọpụta n’afọ ọzọ bụkwa nke ha ga erubere isi.

Ụfọdụ na-ebokwa ya ebubo na ya na Buharị na-egbunyezi n’otu akpa maka na ọ bụrụ na Ndigbo gee ya ntị ghara isonye na nhọpụta ahụ na nke ga-eme ka Buharị turu ugo na ya bụ nhọpụta.

Ndi ọzọ na-ajukwa ihe mere o jiri cheta kpọọ “Jack”, nkịta ya ndi agha Egwu Eke gburu mana o chetaghị ịkpo aha ndi otu ya tufuru ndụ oge ahụ? Ha na-ajụ ma ọ pụtara na isi Jack ka isi ndi otu ya lara mmụọ n’ihi ya.

 

Ajụjụ were bụrụ, Kedu ka Kanụ n’onyeiro ya, ọ sị bụ Jubril ga-esi arụkọ ebe ha chọrọ imemina ya?

 

Leave a Reply

Your email address will not be published.