ỤMỤ EJIMA LỤRỤ ỤMỤ EJIMA

Spread the love

Accra, Gana: Mba Gana nwere nnukwu ọnụ ọgụgụ ụmụ ejima yifere onwe ha oke. N’ọnwa gara aga, ụmụ ejima ụmụnwanyị abụọ lụrụ ụmụ nwoke abụọ na-aza otu aha.

Ụmụ ejima nwanyị abụọ ahụ na-aza otu aha nke bụ Josephina Acheampomaa. N’agbanyeghị na ha esighi otu obodo ma ya fọzịa ibụ ụmụnne, ụmụ nwoke abụọ lụrụ ha na-azakwa otu aha nke bụ Emmanuel Opoku.

N’ezie, oke ihe ịtụnanya nkea gosiri na ụmụ ejima anaghị achọ nkewa chaa chaa.

Nke kachazị ịtụnanya bụ nke mekwara n’Accra n’afọ gara aga mgbe ụmụ ejima nwoke abụọ lụrụ ụmụ ejima nwanyị abụọ. Ha nile kere ekike omenala ndi Gana n’agbamakwụkwọ ha.

 

1 Comment

Leave a Reply

Your email address will not be published.