Ahu otutu nke akpaakwa nwa.

Spread the love

Bu

Ahụ otutu nke akpaakwa nwa (ovarian cyst)

Akpaakwa nwa bụ ihe n’emepụta akwa nwayị ji amụ nwa.
Akpa mmiri nke ana-akpọ ahụ otutu (cyst) n’eto na akpaakwa nwa. Ọtụtụ ụmụ nwanyị n’enwe ahụ otutu na ndụ ha.

Ụdị ahụ otutu nke akpaakwa nwa

(1) Ahụ otutu nke follicle:
N’oge okirikiri ịhụ nsọ nwanyị, akwa n’etu n’ime akpa nke ana-akpọ follicle. Akpa nkea dị n’ime akpaakwa nwa. Na ọtụtụ oge, follicle ma ọbụ
akpa n’emepe, n’ewepụta akwa. Ma ọbụrụ na follicle emepeghị, mmiri dị n’ime follicle nwere ike ibute ahụ otutu.

(2) Ahụ otutu nke corpus luteum:
Akpa follicle n’agbari oge owepụtachara akwa. Ma ọbụrụ na akpa follicle agbarighị, mmepe follicle, mmụbanye mmiri n’eto n’ime akpa, mmụbanye mmiri nkea n’ebute ahụ otutu nke corpus luteum.

(3) Ahụ otutu nke dermoid (dermoid ahụ otutu):

Ihe dịka akpa n’etu na akpaakwa nwa nwere ajị/ntutu, abụba na anụ ahụ (tissue) ndi ọzọ.

(4) Cystadenomas: Ahụ otutu n’enweghị kansa n’etu n’elu akpaakwa nwa.

(5) Endometriomas: Ahu otutu nke n’etu n’ime akpanwa (uterus), nwee njikọ na akpaakwa nwa n’ebute ahụ otutu.

Mgbaàmà ahụ otutu akpaakwa nwa

(1) Afọ ókùkú ma ọbụ ịza aza.
(2) Mmegharị ngịrị-afọ.
(3) Mgbu/ụfụ pelvic tupu ma ọbụ ngwusị nsọ nwanyị.
(4) Mgbu/ụfụ mmekọrịta nwoke na nwanyị.
(5) Mgbu/ụfụ ala ala azụ na apata ụkwụ.
(6) Nro nke árà (breast tenderness)
(7) Inuagbọọ (ọgbụgbọ) na ịgbọ agbọọ.

Oké mgbaàmà ị ga eji gbara ọsọ gaa hụ dọkịnta bụ:

(1) Okè mgbu/ụfụ pelvic
(2) Ahụ ọkụ.
(3) Ịda mba (faintness) na anya ntụgharị.
(4) Iku ume ọsịsọ.

Ọgwụgwọ ahụ otutu akpaakwa nwa

(1) Ịñụ ọgwụ mgbochinwa
(2) Laparoscopy
(3) Laparatomy.

Gbara ọsọ hụ dọkịnta ma gị nwee mgbaàmà ndia

Site n’aka:
Dọkịnta Achụkọ Nnamdị
08035830985

Leave a Reply

Your email address will not be published.