Agentịna:Asọmmpi bọl ndi akpụda

Spread the love

Ajentịna nọrọ n’izu gara aga chịkọba asọmmpi iko Copa America nke ndi akpụda.

Nke a bụ mbụ a na-eme asọmmpi bọl maka ndi mkpụmkpụ.

Morocco nọ n’Afrịka mana eziterekwara ha ozi pụrụ iche isonye mba ndi nọgasị n’Amerịka dịka Chile, Colombia, Argentina, Brazil, Peru nakwa Bolivia.

N’okwu ya, Martin-Klebba, na-agbara otu egwu bọl mba United States-Canada kwuru sị, ” Ihe a bụ maka inye onye ọbụla ohere, ma ndị mkpụ mkpụ, ma ndi kpuru isi ṅa ọ bụ ndi ogbi.  Mee onye ọbụla etu ị chọrọ ka e mee gị.

Facundo Rojas bụ onye isi otu bọl ndi Ajentịba kwukwara sị:” O nyere anyị ohere igosi ụwa ndi anyị bụ nakwa ihe anyị ga-emenwu. Ọ dị mkpa ka a mata na anyị so na ndi nwere nrụhụ ahụ akacha emegide”

A na-atụ anya na n’oge n’adịghị anya, ụlọ ọrụ na-ahụ maka egwu bọl na Naịjiriya bụ NFF ga amalite ịchịkọba asọmmpi bọl ndi akpụda

Leave a Reply

Your email address will not be published.