13 Comments

  1. 1. Aka aja aja na-eme ọnụ mmanụ mmanụ.
    2. Ọkpa akụ eri eri, lekwa ka ọnụ dị ndị nwụrụ anwụ.
    3. Eze mara chị, ọ chịa ọzọ.
    4. Ihe niile kọọchaa Eze, ọjị anaghị akọ ya.
    5. Ọjị Eze dị Eze n’aka.
    6. Ọnụ kwuru njọ ga-emechaa kwuo mma.
    7. Afọ anaghị ekwu ihe ọnụ riri.
    8. Ọnụ anaghị eje be ọnụ gbara aka.
    9. Ekwughị mere ọnụ, anụghịị mere ntị.
    10. Ọnụ na-eri eri adịghị mma ịkwụzị iri.




    0



    0
  2. 1. Ọ bụghị ọnụ akpa dị, e si n’ike tọwa ya
    2. E gughee ụzọ, e gughee ọnụ
    3. A chọwa ihe bi n’ọnụ, a chọọ ewi
    4. Onye nọrọ ebe a na-eke akpa ma o kwughi okwu, e kere ọnụ ya tinye n’akpa
    5. Onye ajọ chi ka miri na-afa n’eze
    6. E kpewe ikpe eze nsị, ewi elee onwe ya anya
    7. Nkịta richaa nsị eze e ree ewu
    8. Ọnụ eji bite akụ abụghị ihe e ji akwụ ya
    9. Agadi nwayi daa nda ada abụọ, a gụọ ihe o bu n’ụkpa ọnụ
    10. Aka weta, aka weta, ọnụ eju
    11. Eze onye agwalam nyụrụ nsị buru n’akwa madụ nile gba ya nkịtị
    12. onye fee eze, eze eruo ya
    13. A nụta a kaara eze ka eze ji achị
    14. E lewe agadị nwayị anya n’ọnụ, ọ dịka o jighi ya ṅụọ ara
    15. onye arachaghi ọnụ ya, ụgụrụ aracharaa ya ya




    0



    0
  3. (1) Ihe agbotara na akuku ite na-ala na agugu onu.




    0



    0
  4. 2. Gidigidi bu ugwu Eze

    3. Nkita richa nsi Eze ere ewu

    4. eze fọgodu otu, a ga n’ata atụ

    5. A gbakata Eze nkịtị, ekpudo nkata n’isi gwa ya okwu.

    6. enweghi onye ma afọ ga amụ eze

    7. Were ire gi gụọ eze gi ọnụ.

    8. ọdighi mma Nkita rachasia nsi, eze ere ewu.

    9. Ọchị eze abụghị ụtọ

    10. Eze mbe si na olu oha di mma, mana
    oriri oha na-aka ahu.

    11. Eze mbe si na ihe ya ji-achiri ihe egwu
    ya aga njem bu maka ya ezu ndiegwu.

    12. atala m ukwa jaa eze

    13. owerri sụ uyo wu uyo mi na gi,ta ugba m, ṅuọ mmai m ma jiri ogodo nwanyi m mee m eze.

    14. anaghi agba aka ahụ nwata eze

    15. Oka ka ire ji binyere eze

    16. Nkita richa nsi Eze ere ewu

    17. Ochi Eze abughi uto

    18. Nwata kwocha aka osoru ndi Eze rie nri

    19. onye otu anya na achi eze be ndi isị




    0



    0
  5. 11. Agadị nwanyị daa nda ada na abọ, agụọ ihe o bu n’ụkpa ọnụ.
    12. Nwamkpi sị na njepụga amaka; na ya jepụgara wee mụta ịsọkeli ọnụ ya elu.
    13. Ọ na abụ onye erughi ka Eze ọ sị lie ya ka Eze.
    14. Nke onye dị ya mma; ya kpatara onye Eze ji ghụchaya ure eze ya rachaa.
    15. Ihe ewetara na agịga ọkụ na-aga n’agịga ọnụ.
    16. Ọnụ na-eri adịghị mma ibu ọnụ.
    17. Anyụkọọ maamịrị ọnụ ọ gbaa ụfụfụ.
    18. Otu mkpụrụ aka rụta mmanụ o zuo ọra ọnụ.
    19. Eri agọ ekweghị ụmụ nwanyị gbaa afụ ọnụ.




    0



    0
  6. 20. A guhe uzo a guhe onu

    21. E lewe ogaranya anya n’onu, o di ka onughi are nne ya

    22. O nweghi onye atunyere nnu n’onu ogbupu ya

    23. Aka aja aja na-ebute ọnụ mmanụ mmanụ

    24. E jighi ọnụ etinye azụ n’azụ n’ofe

    25. Ekwughi ekwu meru onu,ekwuo anughi melu nti

    26. Onu akoro Onye uwa by Chi ya ka akoro ya

    27. kama ọnụ n’eri ga akwụsi ịrị, nke na eribeghi erila

    28. ọnụ kọjọrọ ogiri ga emecha kọrọ ogiri rachaa

    29. ọnụ ejiri bite akụ abụghi ọnụ eji akwụ ya

    30. ọnụ akọrọ onye ụwa bụ chi ya ka akọrọ ya

    31. ejighi ọnụ egbụ ọrji.

    32. Were ire gi gụọ eze gi ọnụ.

    33. A nyụkọ mamiri ọnụ, ọ gba ọfụfụ.

    34. Ogbu opi na eficha ọnụ.

    35. Ụdara si na ọ bụ sọsọ ya mụtara nwa ana apiwa ọnụ

    36. Nwata kwuwa ọnụ ọ si na ya agwagbụe okenye na okwu.

    37. Onye hapu onu ya, uguru arachaa ya.

    38. Ogbo na ogbo ra,bu na okwu onu.

    39. ọnụ kwurụ njọ ga ekwụ mma

    40. ọnu gi bụrụ mma, o bee gi ịre

    41.Elebe okenye anya na ọnụ odika ojighi ya wee ṅụọ ara

    42. o ji nkakwụ bee ya ọnụ, o ji ọkụkọ bee ya ukwu

    43. anyụsia nsi apighi ya ọnụ, ọ buru nsi otoro

    44. Onu Anaghi aga be onu gbara aka

    45. Ofor ka idide ji awa onu

    46. E kwere maka ihe ọnụ kwuru, egbukaa ụlọ

    47.Aka nọrọ nkịtị, agụụ egbuo ọnụ

    48. ọnụ kpụrụ nri n’ọnu, ọ gba nkịtị

    49.Na ọnụ kwuru kwute bụ onye Chukwu chọrọ ịzọ ndụ




    0



    0
  7. 50. Onweghi ihe erichara luo eze
    51. Onye tete ura okuku chowa ya oso, ya gbalaga maka okuku nwere ike iji abali puo eze.
    52. Okenye choro ire any oke n’eji eze ekere ya umuaka.
    53. Agwuru n’eji eze ari elu osisi ma osisi n’elu Ilu.
    54. Gi hu ijiji n’onu mmadu ,hapu ya maka amaghi ma ndi ebe ya ona-ata ijiji.
    55. Ochi eze abughi ihu n’anya.




    0



    0
  8. 50. Onweghi ihe erichara luo eze
    51. Onye tete ura okuku chowa ya oso, ya gbalaga maka okuku nwere ike iji abali puo eze.
    52. Okenye choro ire any oke n’eji eze ekere ya umuaka.
    53. Agwuru n’eji eze ari elu osisi ma osisi n’elu Ilu.
    54. Gi hu ijiji n’onu mmadu ,hapu ya maka amaghi ma ndi ebe ya ona-ata ijiji.
    55. Ochi eze abughi ihu n’anya.
    56. Ogbu opi si na g’egbu opi ma Nne ya nwuo, Nne ya anwuo otito etuo ya na onu




    0



    0
  9. 20. Nwata tụnye ọnụ n&ọkwụ, ọ tụnye akụ ya.
    21.Onye nọ mmadụ nso na-anụ isi eze ya.
    22. Enye ọnụ, imi ebewe na-enyeghị ya.
    23. Onye a na-enye nri na-ewega ọnụ ya.
    24. Ọnụ kwuru njọ ga-emechaa kwuo mma.
    25. Onye fee eze, eze eru ya.
    26. Ọmetụ imi, ọmetụ ọnụ.
    27. Akpụchaa isi a haa eze ntutu.
    28. A kpaa nkịta eze, ijiji ebewe ya n’ọnụ.
    29. Anaggị ahụchaa ọnụ nnụnụ, chọwa ebe a ga- esi enye ya nri.
    30. Akwụ ruo n’ikiri a chọwa nnụnụ ọnụ opiropio.




    0



    0
  10. 31. Anaghị enwechaa osimiri were ọnụ mmiri na-eso mma.
    32. Agaggị m anọ nga dibịa na-eke ọgwụ kere ọnụ m.
    33.’Eze sị na ọ bụ nka ka ya na ire jiri biri na ya makwa na ọ bụ ihe oriri.
    34. Eze a na-asọ anya sọwakwa onwe ya.
    35. Eze anaghi eze n’ụlọ ya.
    36.Ikpe mp ọnụ agba e huru.
    37. I bo danda ala n’isi dị mfe n’ọnụ , ma e bee ka a gp-ejide aka aka wee buwe?
    38. Ihe niile kọchaa Eze, mmanya anaghị akọ ya.
    39. Nwatakịrị na-egwu ọnụ abụzụ nọkata mawa mbazụ ya amawa, ọ bụrụ na ọbụghị agwọ ka o gwutere mara na ọ hụla ihe yiri agwọ.
    40.Nwoke n&alị ibe ya, aja ọcha na-eju ya ọnụ
    41. Mkpu bara eze nwoke ọnụ ezenwanyị buru ụzọ na-eti.
    42. Ogbu opi na-ehicha ọnụ.
    43. Nwata m na-atara ji, ya tabiri m ọnụ mụ na ya onye buru ụzọ mata ụtọ ji?
    44. Nwata na-amabeghị ụhe , anaghị ama n’agwọ nwere eze ma ya uọdụ na ọ na-atp mmadụ ata.
    45. Ọnya taa mmadụ ọ mara na ijiji nwere eze.
    46. Ọbụrụ na ọ nweghị ihe dị akpa aji n’ime, anaghị ekechi ya ọnụ.
    47 Mmiri na-amachapụ ije ụkwụ ma ọ naghị amachapụ okwu ọnụ.
    48. Okenye a sị ya kuru nwa, ya sị eze adịghị ya n’ọnụ, a sị ya tagbuo ya atagbuo?
    49.Ọhịa abụka enyi enwe, ka ajị rujuru ya ọnụ, ọ kpachara ya.
    50. O rijuru afọ amaghị n’ibe ya bu ọnụ.
    51. Onye taara nwata ji adịghị ka onye bu onụ.
    52. Ọ naghị abụ a gụ nwammụọ e ghewe ọnụ oye.
    53. Ọ na abụ ekwepụ dibịa ọnụ aku, ọ bụọ mgbọrọgwụ n’ajọ ọhịa.
    54.Anya lebere lefuo, ọnụ kwube kwutekwa.
    55. Ejewe ejewe a kaara Eze, a lawa alawa a kaara Eze.
    56. E buru ọnụ na-agba aja, ọ na-esi mmụọ mmụọ.
    57. Ihe ụwa bụ – mgbe oke ata akwụ, mgbe oke ajụ ọnụ n’igbegiri.
    58. Ọ na abụ ihe ju akpa, a machie ya ọnụ.
    59. Ọ bụghị ihe ugoro na-ada n’ọnụ ka ọ na-atọ n’ụtọ
    60. Ọkpa akụ eri eri , nekwa ka ọnụ dị ndị nwụrụ anwụ.
    61. Oriri abụghị ọṅụ nkahie.
    62. Okwuchara emeghị eme rere ọnụ ya.
    63. Onye kee ji kee ọnụ ya, ọ gaghị erepụ ji ya.
    64. Isi na isi ha bụ n’okwu ọnụ; mmadụ ka ibe ya.
    65. Onye ọbụla osisi hara ọnụ dagburu, ọ bụ ntị ya mere ya.
    66. Ọ na abụ eghewe ọnụ oghe wee kpọọ ‘uturu’ , ọ dị ka a kpọrọ ‘otoro’.
    67. Onye otu anya na abụ Eze na ala ndị isi.
    68. Ọta akwụ kapịba ọnụ, Ị mara na ọ ga-agbụpụ ya.
    69. Onye bụ nwanne awọ zọlata ya afọ; onye bụ nwanne nkapị belata ya ọnụ.
    70. Oke amakwala ụma ata akpa nwa dibịa ka nwa dibịa ghara ịma ụma wee bụọ ya ọnụ.




    0



    0
  11. 71. Ọ bụ n’ihi ejighị ọzọ ka nke akpụ n’ọnụ ji ata ahụhụ.
    72. Ike nọọlụ Eze, ọ chịa nke ọma.
    73. ‘Agaghị m eri’ ji eze ekere ụmụazị, ọ mere gịnị?
    74. Onye ji ohu ụkwụ pịa eze, ọ ga -achịta gịnị n’ọchị?
    75.Nkapị sị na ya bụkwanụ nwa anụ kama na ọnụ nne ya ekweggị ka a mara ya.
    76. Aka jụọ oyi, mgbei a ma ọnụ.
    77. Ọ bụ naanị obodo ji eze arị elu maara osisi na-elu ilu.
    78. Ụkwara na aka mma n’ọnụ onye gbụpụrụ ya.
    79. Okwu okenye bụ ọnụ ndị mmụọ.
    80. Akwa nwamkpi dị ụrụghụrụ n’ọnụ.
    81. Iwe wechaa onye nchiche, ọ ga atabiri ya ọnụ ya?
    82. Aka anaghị agba afọ were eru nwata n’ọnụ ya.
    83. Onye ọnụ ya rere, anaghị agbata ya agbata.
    84. A naghị ekecgi ehi na-azọcha ọka ọnụ.
    85. Onye amụma anaghị abụ Eze n’ala ya.
    86. Ọchị otu onye na-ere eze.
    87. Ọ bụ onye ma nkịta na-amanye ya aka n’ọnụ.
    88. Ọnụ sere ọgụ.
    89. Egbugbere ọnụ anaghị anọrọ mmiri amaa eze.
    90. Agadị nwanyị ekunyerenwa ọ sị na ya enweggị eze, a sị ya tagbụọ nwa?




    0



    0
  12. 91. Okwu baan’ego, ọgbenye e sere ọnụ ya.
    92. Kama chi m ga-enye m ego n’ụtụtụ ma mgbede e buru m ọnụ, ya nye ya na mgbede ka ọ wee nee m nka.
    93. Kama tabiri taghawa eze, ya nọtọ n’ọkụ jụọ oyi.
    94. Ọ na abụ ekwe iakarịa ọnụ, a gwa ya aha osisi e ji tụọ ya.
    95. Ọta akwụ enweghị mkpanaka, nke ọ kpụ n’ọnụ aghọọ abịrịbọ.
    96. Mbe sịrị na ihe ya chọrọ bụ ka a kpọsa ya ebe a kpọsara enyi n’ahịa ma sị rezịa ya ihe ọnụ ahịa ya ruru




    0



    0
  13. Author

    ỌGBỤGBA OKWE: UJU NWANEKEZIE 96 (94), DỌKỊNTA ACHUKỌ 56 (56) MAZỊ IKE ỌJỊ 15 (15)




    0



    0

Leave a Reply

Your email address will not be published.