Ike Ịjụ ụzọ na Dọkịta anya

Spread the love

NKWUPỤTA ONYE JIRI ỊHỤ ỤZỌ YA KPỌRỌ ÍHÉ.

Ebe e jiworo onyinye nsọ nke bụ ikikere ịhụ ụzọ gozie m, ọ ga-amasị m na onyinye a ga-anọgide oge ndụ m nile. I ji mee ka nke a dị írè, enyelam onwe m iwu ndi a dịka o
ọrụ:

(1) Ị dozi ma chekwaa ókè nke ịhụ ụzọ m; na ekweghị ka ọria nkwarụ, ma ọbụ ọghọm ọbụla mebie ya ma ọbụ gbochie m ị nweta anụrị sitere na ịhụ ụzọ m n’uju.

(2) Ịgbambọ nile ị nweta ma debe ike ịhụ ụzọ n’uju na anya nwere ezi ahụike; na akpọnyeghị n’imi ihe ọbụla n’edoghị anya nke m chọpụtara gbasara anya m, ị dị na-ahụ dọkịta anya m oge ọbụla, na-edebekwa ndụmọdụ dọkịta anya oge nile. Agaghịm atụnye ọgwụ adịgboroja n’anya m, ma ọbụ ñụọ ihe ọbụla dịka ọgwụ nke na-abụghị dọkịta depụtara m.

(3) Ị cheta oge nile na ahụike bụ ụba; marakwa na enweghị ike ịhụ ụzọ g’egbochi m ị nweta uru nile dị na ndụ m n’uju.

(4) Ịme ka ndi ezinụlọ m na ndi enyi m mata maka ókè nke ịhụ ụzọ ha ruru ha oge nile. Ka ha nwee ike ịgbochi isi, ma hapụ ịbụ ibu ọrụ nyerem ma ọbụ nye obodo, n’ihi na ha kpuru isi, dika m si na-agaghị abụ ibu ọrụ nye ha site na ikpu isi.

Ka Chineke nyere m aka.

1 Comment

Leave a Reply

Your email address will not be published.