6 Comments

  1. 1.Aka aja aja na-eme ọnụ mmanụ mmanụ.
    2. Isi akwụ dara n’ala emetụla aja.
    3. Ọnweghị ebe egburu aja ngwere anọghị.
    4. Akpọọ nkịta ụzọ oku n’abụ ọ bọnye onwe ya aja n’anya.
    5. Elu eru aka, ala eru aka.




    0



    0
  2. 6. Akwa ọkụkọ tịwa akụ, ihere emegbuo nkume.
    7. Atụrụ sị na ọ na avụ ya na-eleeu anya ala, ụmụ anụmanụ ibe ya asị na ya dị nzuzu.
    8.A na-egosi nwata awo n’ikpo okwute , a na-atụrụ ya aka n’ihi na awọ na okwute na-eyiwe onwe ha.
    9. Ahụ sị na ya bụ otu , ma ọ nọdụ ala ike ekewaa.
    10. A na-asọ isi ede anya, ala ede asị ọ bụ ya ka a na-asọpụrụ.




    0



    0
  3. 11. Anụ dinere n’ala dinere n’akpụkpọ ya.
    12. Agwọ a na -akpọ okporo sị, na ya anaghị ata ma ọbụrụ na ya akụghị isi n’ala.
    13. Enyi buru ibu elu , buo ibu ala, ma ọ naghị ahụ ihe dị ya n’okpuru.
    14. Egbe na-efe n’elu ma nyogo ya na-aga n’ala.
    15. Ebe nwamkpi na-akụ amụ n’ala bụ na be onye nwe ya.
    16. Ebe mgbada loro ala ka esi awụ ya.
    17. Ewu richaa ihe onye ubi, ya fee oke ala.
    18. Ihe dibịa na-agwọ bụ duru neere , ọ naghị agwọ ala eri ozu.
    19. I bo danda ala n’isi dị mfe n’ọnụ, ma ebee ka a ga-ejide ala aka wee buwe.
    20. Mkpi sị elu epula ala epula, ma ya bụrụ naanị ọsọ nwa okorobịa na ibe ya.




    0



    0
  4. 21. Nnụnụ juru elu n’ala, jukwa ọhịa n’ụzọ, naanị aha nnụnụ nwata mara bụ egbe.
    22. Nwoke na-alị ibe ya, aja ọcha na-eju ya ọnụ.
    23. Nwata a na-etiri akị amaghị na iwe na-ewe nkume.
    24. Nwa ewu ga-egbu ikpere n’abụ n’ala ọ gaghị aṅụta nne ya ara.
    25. Nwaatanị sị n’ala a kụrụ ya anaghị ewute ya, kama ọ bụ onye sị gbaa ya n’ala.
    26. Nnọdịkwa m n’ala hụ ete ọrụ.
    27. Onye metere enyi nwanyị ụkwunji, nwe kugobe yp elu , nwe kutuo ya ala.
    28. Okpoko ụtara dara n’ala edetụla aja.
    29. Onye na-adụ onye ohi odụ , ya na-adụkwa ji na-awa ala.
    30. Okpu aja dara olulu a laruola ikwu nne ya.
    31. Ọgọdọ kpuchie ahụ, nke na-akpụ n’ala bụ ụgha.
    32. Onye jiri udu fụgbuo ewi amaghị n’igwu ala bụ ọrụ.
    33. Onye ji mmadụ n’ala ji onwe ya.
    34. Ori nga mmadụ a gbadewe igwe, nga ya ndụ aja ọ nọghị ya?
    35. Okokporo gbaa ọsọ elu gbaa ọsọ ala, ntụ ụtụtụ nọ na-eche ya.
    35. Okenye gburu ikpere na’abụ n’ala enye nwata ngọzi, ọ na-enye mma, ka ya ma, ọ na-enye njọ ka ya ma.
    36. Onye mara asụ ọ sụọ n’ikwe, onye amaghị asụ, ọ sụọ n’ala.
    37. Onye ero gburu nne ya, gbuo nna ya, o tolite riwe ero, ka ya ji aka ya waa ala ili ya.
    38. Ọdị mma ka olu sụọ n’ala ma ya ejila eji.
    39. Ogwumagala sị, mgbe ya pụtara ụwa n’ala akaghị aka , nke a mere ya ji nwayọ nwayọ na-azọ ụkwụ n’elu ya.
    40. Ụsụ abụghị anụ elu ọ bụghị anụ ala.




    0



    0
  5. 41. Onye akọrọ ọgwụ, o bie aka n’ala sị, ọ bụrụ ọgwụ ya erekwala; ọgwụ ọ refọrọ gịṅị.
    42. Ọ na abụ ọta akị nyara ụyọrọ nkume, eleghasịa ya anya.
    43. Ọbụghị ilo nkume bụ isi okwu, ebe okoro nọ bụ ịnyụ ya anyụ.
    44. Ọkwo m n’azụ ma ụkwụ m na-eru ala, ya hapụ m ka m were ụkwụ m gawa.
    45. Nnụnụ si n’ala fepụ wee bere n’elu ọkpọkịịkwube, ebe mbụ ọ nọ ka ọ nọkwa.




    0



    0
  6. 46. Nkịta gbara ikpo na-eri nsị, ọ dị ka ọ na-arịọ ala arịrịọ.
    47. Ọ na abụ ike nọdụ ala ọ taa ọjị.
    48. Mkpu sị na ya na ụmụnne ya nọ n’ime ala bụrụ otu; o ruo ka ha pụtara n’elu ala, ụuọdụ wee ghọrọ akụ felịe elu, ya wee tiwe mkpu na-ajụ sị, ” olee mgbe nke a bidoro?”
    49. Nkume mara mma dị n’Ụzọakọlị kama ọbụzị onye mbulata.
    50. Ọ na abụ nwata nyobe omimi ike ya, isi akpọọ ya n’ala.
    51. Enyi zọọ ụkwụ n’ala, ntị ga-anụ ya.
    52. Ezi sị na iwe ya bụ na onye nwe ya na-aga na-azụ ọgụ n’ahịa ebe ya nọ n’ụlọ were ọnụ ya na-egwu ala.
    53. Onye ọbụla nwe ala nwe mụọ bi n’ime ya.
    54. Ọka mgba adịghị enwude ala.
    55. Okorobịa ọbụla nyụkatara nsị bidowe aka n’ala , Ị mara na o siwo na dimkpa pụọ.
    56. Onye bi n’ala anaghị aga ohi aja.
    57. Ọ na abụ nwata gbata ala obi, ọdị ya ka ala nile abụrụla nke ya.
    58. Ọkụkọ gbakarichaa ala, o yie otu mkpụrụ akwa.
    59. A naghị eli anwụrụ ọkụ n’ala.
    60. A naghị anọ n’ala ama ụsụ dị ime.




    0



    0

Leave a Reply

Your email address will not be published.