ZIMBABWE:Ndi uwe ojii awakpola onye amụma maka ọgwụ HIV

Spread the love

Ndi uwe ojii awakpola otu onye amụma na-ewu ewu na mba ahụ aha ya bụ Wọlta Magaya, onye nke sị na ya achọpụtala ọgwụ HIV/AIDS.

Onye amụma ahụ nwe ụka The Prophetic Healing and Deliverance Ministry kwuru na ọgwụ ahụ bụ mkpa akwụkwọ ana-akpọ aguma nke nwere ike igbu nje HIV n’izu ụka abụọ.

Mana ndi uwe ojii mba ahụ na-ekwu na ha wakporo ụlọ ọrụ ya iji were mee nnyocha banyere ọgwụ ahụ. Mazị Pọl Nyathụ, ọnụ na-ekwuru ndi uwe ojii na Zimbabwe sịrị na onye amụma ahụ na-enyeziri ha aka na nnyocha banyere okwu ahụ.

Magaya kwuru sị:”E nyela m madụ olenole ọgwụ a, ọ gwọọ ha n’izu ụka abụọ. Ụlọọrụ si mba Amerika ekweela m nde dọla iri ise n’isii ( $56m) iji gosi ha mkpa akwụkwọ a bụ aguma ma a jụrụ m ajụ”

Mịnistrị ahụike nke mba Zimbabwe na-ekwu na ọgwụ ahụ anatabeghị ikike ha ebe onye amụma Magaya na-achọ ibu ya bụ ọgwụ ọ chọpụtara pụọ ofesi maka na “onye amụma anaghị enwe ugwu n’ala nna ya ”

hoo!haa!! chetakwara udiri nsogbu na mmekpa ahụ e nyere ndi Naịjiriya ndi sịkwa na hachọpụtara ọgwụ maka nje HIV, ndi dịka Agbalaka nakwa Ọkammụta Ezeibe. Ndi isi ojii, e mere anyị ihe a eme?

Leave a Reply

Your email address will not be published.