Nwoke kagburu agbamakwụkwọ nwa ya ụbọchị agbamakwụkwọ

Spread the love

Ibadan: Ebelebe gburu ụbọchị satọdee a gara aga bụ abalị atọ nke ọnwa Nọvemba n’Ibadan mgbe otu nwoke kagburu agbam akwụkwọ ada ya nwanyị, Oluwaseun Adugbe na onye chọrọ ịlụ ya bụ Tunji Curtis  ka ọ fọdụrụ elekere olemole tupu ụka agbam akwụkwọ amalite.

Mazị Adugbe, onye Edo Steeti nakwa nna nke nwanyị zipuru ozi na-agbam akwụkwọ ahụ enweghịkwa isi ma gwakwa ada ya ka o bughachi ihe nile ndi ọgọ ya zụitara ya na ekwughi ihe bụ iwe ya.

Iwe juru ụmụnne nke nwoke obi. Ọtụtụ n’ime ha si Legọsị bịa mana ọgọ ha emeghi ka ha mata ebumnobi ya.

Tunji na Oluwaseun ayịwọ afọ ise ma mụtakwa nwa na-achọzị ịgba afọ ise.

Mgbe ndi be Tunji jụsiwere ya ajụjụ ike, Mazị Adugbe sịrị na iwe ya bụ na Tunji jụrụ ịbịa ọgbakọ etinyere Fraịdee ahụ kwesịrị ịdị n’etiti ya na ndi be nke nwanyị.

Tunji kọwara na ọ bụ mgbagharị mere ya abịanwụghi ọgbakọ ahụ etinyere n’elekere mbụ nke ehihie. Ọ sịkwa na mgbe o mechara rute na mgbede na a gwaghị ya na-akagbuola agbam akwụkwọ ahụ.

N’obi mgbawa, ọ sịrị, “Obi mapụrụ m. Mụ na nwunye m enweghị nsogbu ọbụla, mụ na nna ya enweghikwa okwu. A ka m zigara nna ya ego izu gara aga ”

Ka a jụrụ ya ihe bụ ebumnobi ya, Tunji sịrị:” Ugbua, a chọgodiri m ichefu ajọ njakịrị a h gaa ka isi jụọ m oyi. M teta ụra echi ka m mara ihe m mere”

Ọlayinka Ogunbajọ, nwanne nke nwoke bụ achịcha agbam akwụkwọ si Legọsị bịa sịkwa na nna nke nwanyị nabatara ha na be ya ọfụma n’uhuruchi Fraidee ahụ ma gosikwa ha ebe ha dọwara achịcha ahụ na emeghị ka ha mata ebumnobi ya.

Obodo adịghị mma bụkwa uru ndi nze. Ụfọdụ ndi agbataobi nke nwanyị ji akpa ebukọsị anụ n’erimeri ndi a kaara iji mee oriri agbam akwụkwọ ahụ.

Ma nwanyị a ma nna ya, enweghị onye kwere ịgwa ndi nta akụkọ ihe ọbụla.

Chaị!!!! Nwoke n’ihe

Leave a Reply

Your email address will not be published.