5 Comments

  1. 1. Akwa ọkụkọ tiwaa akị, ihere emegbue nkume.
    2. Dimkpa tie akị, ahụ ichere ya.




    0



    0
  2. 1. Anaghị etiri ụkwa nọ n’elu akị
    2. Chi kere akị oyibo ga-ekunye ya miri ọ ga aṅụ
    3. Nwata kakarịa ụkwa e gheere ya nsị ewu
    4. Oge ụkwa adịghị anaghị ata nsị ewu
    5. Ohi chọrọ ịpara ụkwa para ụkwa ya asịla na ụkwa chọrọ ịsugbu ya
    6. Ewu na-akpa n’ụkwa amaghị na ụkwa na-etigbu ewu
    7.




    0



    0
  3. 3. Agaghị m akwọ aka tiere ọkụkọ akị.
    4. Akị gụrụ nwata agụụ anaghị ata ya afọ.
    5. Ụkwa ruo oge ya, ọ daa.
    6. Ọ na abụ ọta akị nyara ụyọrọ nkume; eleghasịwa ya anya.
    7.Ọgwu ma ụmp amakụ ukwa; ya na ụkwa abụghị nwanne.
    8. Ngwere fara pịa eze ọ ga-ejụ ta akị ma chi fo; o ruo n’ụtụtụ ọ hụzie nkụ akị n’ala.
    9. Ọ na abụ Dimkpa taa akị, ahụ ichere ya.
    10. Ọ na abụ e tie akị mbara mbara, ọ gbakpọọ onye mbara mbara anya.
    11. Ụkwa dara ụbọchị obodo na-eme mmemme adaghị n’oge.
    12. Nwata a na-etiri akị amaghị na iwe na-ewe nkume.
    13. Mgbe a na-ahọ ụkwa, emee họọ irende ya.
    14. Anaghị anọ n’ukwu ụkwa aghọta ube, ị mee etu ahụ, ụkwa adagbuo gi.
    15. Akị na nwanne ya bi n’otu ụlọ ma were ichere kpaa oke.




    0



    0
  4. 16. Ọ ta akị anaghị ama mgbe iwe were nkume.
    17. Anaghị atọ ute edina ala n’ukwu ụkwa.
    18. Ofeke anaghị ama mgbe e kere nkụ ụkwa.
    19. Akị bekee sị na ọgaranya na-eri na ntụpe.
    20. Ụkwa dara taa, e rie ya taa bụ ajọ ụkwa.
    21. A na-esi na ntụtụ ụkwa ama onye ụbụ nri.
    22. Onye buru ụkwa gaa osimiri, osimiri eburu ya buru ụkwa ya.
    23. Aga m eji maka na Orieji siri ụkwa wee kpọọ ya elele?
    24. Onye ọbụla tichara akị hapụ ichere dere aha ya na nkume.
    25. A hụ akị hụ achịcha, Ị mara na ihe e ji akpa ụganị ezuola.
    26. Onye jere obodo oyibo na onye rịrị elu akị oyibo bụcha oyibo oyibo.
    27. Ụkwa a na-apị mkpụrụ a dịghị ya.
    28. Ọ bụ ka agadị nwanyị si aṅa ụkwa ka ụkwa si aṅakwa ya




    0



    0
  5. ỌGBỤGBA OKWE: UJU NWANEKEZIE 25 (28), MAZI IKECHUKWU ỌJỊ 6 (6)




    0



    0

Leave a Reply

Your email address will not be published.