OSISI ỌJỊ: IHE Ọ PỤTARA N’ALA-IGBO

Spread the love

ỌJỊ, OKE OSISI! N’ala-Igbo, ọjị bu oke osisi Ndigbo kwenyere n’adighi akụ ya akụ kama ọ bụ Chukwu na-ewube ya. A na-asọpụrụ osisi ọjị maka na e were ya dịka arụsị maka na adịghị egbu ọjị na nkịtị.. Kama n’omenala Igbo,  ana e mere ya omenala tupu egbuo ya bụ osisi. Nkea bụ n’ihi na ndigbo mgbe gboo na-agọ ọjị dịka arụsị.

A na-enweta oke osisi a nke aha sayensị ya bụ Milicia Excelsa na mpaghara ikpere mmiri Ọdịda anyanwụ Afrịka. Ọ na-akakwa nka dịruo Narị afọ ise.

ìrókò, logo ma ọ bụ loko ka Yoroba na-akpọ ya. Osisi a watara na ya na-esikwa nnukwu ike nke mere eji ya arụ ihe dị iche iche dịka ụlọ, akwa mmiri, oche w.d.g.

N’ihi udi ugwu a na-akwanyere osisi a, ejighi nkụ ya esi nri. Ukwu ya na-enyekwa ndi mmadụ ndo ma bụrụkwa ebe a na-eme ọgbakọ.

Etu o siri dị n’Ala-Igbo, mpakara osisi ọjị daa, ị mara na ihe ukwu ga-eme dịka ọnwụ oke mmadụ ma ọ bụkwanụ ọdachi ndi ọzọ.

Ụmụ nnụnụ n’anụmanụ jikwa ya mere ọnọdụ nakwa ama egwuregwu. N’ezie, osisi ọjị di omimi n’ebe omenala igbo di. Osisi ọjị bụ eze osisi nile maka na oke osisi adịghị epu na nkịtị.

Ma ọjị a bụ arụsị, ma ọ bụ osisi nkịtị, ihe doro anya bụ na ỌJỊ BỤ OKE OSISI. N’ihi ya, onye rịrị ọjị kpaa ya nkụ maka na anaghị ọjị kwa daa

OLISA ỌHAEFESI(Nwata okenye kwụ na-azụ)

SULEJA, NAỊJA STEETI

1 Comment

  1. Ọdee, daalụ rinne. Ekwenyechalụ m ihe niile Ị dere belụsọ na e jighị osisi ọjị eme nkụ. Ọ bụ ndị obodo gị ejighị ya eme nkụ ka ọ bụ Igbo niile? Ndị be anyị ji ya eme nkụ. Daalụ.




    0



    0

Leave a Reply

Your email address will not be published.