DIAMOND BANK:MADỤ ANA AKWỌ ONYE KA YA?

Spread the love

ỤLỌAKỤ Diamond Bank PLC nọrọ ụṅyahụ kọwaa dịka ezigbo asị bụ akụkọ na-efegharị ebe nile na ụlọakụ Access Bank Plc chọrọ ịzụrụ ya.

Nwaada Chiọma Afe, ọnụ na-ekwuru ụlọakụ ahụ nọrọ n’ozi o zigara ndi nta akụkọ were kọwaa na-akụkọ ahụ bụ asịrị na-enweghị isi.

“Anyị chọrọ ikwuputa hoo!haa! na ụlọakụ a na ndi ọbụla anaghị akpa nkata ịbịakọta ọnụ ma ọ bụ nweghara”

Akwụkwọ akụkọ “The Nation” buru akụkọ na Access Bank na-achọ iweghara Diamond Bank iji were kwalite ọnọdụ akụ ha nwere n’aka

Ụlọakụ Access Bank kọwakwara na eziokwu adịghị n’okwu ahụ.

Ihe doro anya bụ na “e nwere ihe mere ede jiri bee nwịị” N’ezie, kemgbe Mazị Ụzọma Dozie weghara ọnọdụ dịka onyeisi n’ụlọakụ Diamond Bank nke nna ya bụ Mazị Paskal Dozie hiwere na ihe amachaghịzị kwụrụ.

hoo!haa!! were na-ajụ sị, “Madụ ana akwọ onye ka ya?” Diamond Bank n’Access Bank, kedu nke ka ibe gbasie ike, dịkwa ndụ?

Leave a Reply

Your email address will not be published.