Eze Ndigbo agaghị adị na Krọs Rivas

Spread the love

Kalaba: Ndi Eze Ọdịnala Krọs Rivas Steeti adọọla Ndigbo bi ebe ahụ aka na ntị maka inwe Eze Ndigbo ebe ahụ n’ihi na ọ ga-abụ ” ihiwe alaeze ebe ha enweghị ikike ya”

Nkea bụ maka atụmatụ ụfọdụ Ndigbo bi ebe ahụ nwere ichi otu nwoke a na-akpọ E. A. Ezenweanyi Eze Ndigbo na Kros Rivas Steeti.

Ndi Eze ahụ kwukwara sị, ” Ndigbo nọ na Krọs Riva Steeti nwere ikike imere onwe ha ọgbakọ ma họpụtakwa onye ndu nke ha nwere ike ịkpọ Onyeisi Ndigbo na Krọs Riva, ọ bụghịzị ịza Eze Ndigbo”

“Onye ndu ha ahụ agaghị azakwa aha edobere sọọsọ ndi eze dịka Onye Eze (His Majesty ), Onye Eze dị Elu ( His Royal Highness), wdg.

Ozi ahụ nke Eze na-achị Bakasi nakwa onyeisioche ndiEze na steeti ahụ bụ Etim Edet nakwa Onye Eze na-achị obodo Kalaba bụ Patrik Agbọ tinyere aka kwukwara sị, “Ndigbo bi na Krọs Riva nwere ike ime mmemme imerube ụbọchị ha ma zịkwaa ndi eze ebe ọbụla ”

Edet sị na ha kpọrọ ndi eze n’Ala-Igbo ndi mere ka ha mata na ndi nwere ikike ịza Eze Ndigbo bụ ndi Eze ọdịnala n’Ala-Igbo

“Mgbe m jụrụ maka ndi na-aza ya ugbua, ha gwara m na ndi ahụ na-eme nkea n’ụzọ iwu akwadoghi, na ha kwesịkwara ịkwụsị ya.

Leave a Reply

Your email address will not be published.