NDI EZE ERI GA-EKPOCHAPỤ OSU

Spread the love

Ndi Eze Eri nile ekpebiwo ikpochapụ “Osu” n’Ala-Igbo na mmemme mkpochapụ ga-adị n’abalị iri abụọ n’asatọ nke ọnwa Disemba afọ a.

Ozi anyị nwetara kọwara na ya bụ mmemme ahụ ga-abụ n’obi EzeNri n’Anambara Steeti.

Ozi nke si n’aka Onye nọgodu ka EzeNri ugbua bụ Ọkpala EzeNri Ikenna Onyeso kọwara na ọ ga-abụ “madụ ịbụ onwe ya ọnụ” bụ onye ọbụla ikwenyekwa n’osu ma ekpochapụchaa ya.

Ọ sịrị: “Site n’ụbọchị ahụ, oke abụmọnụ ga-eso onye ọbụla laghachikwara azụ na ya bụ ajọ omenala megidere ugwu dịịrị onye ọbụla bụ mmadụ”

N’okwu nke ya, onyeisioche ndi Eze si Eri, Eze Nkeli Nzekwe Kelly (Ọkalakwụ Ịgbarịam) sịrị na ụwa nile kwesịrị ịbịa hụrụ ihe ga-eme n’ala anyị n’abalị iri abụọ n’asatọ nke ọnwa Disemba maka na udiri ihea emebeghị mbụ.

Oge ikpeazụ emere udiri ihe a bụ narị afọ abụọ gara aga. Gekwaa m ntị, emechaa mkpochapụ nakwa ịkpụ arụ a, onye ọbụla gakwara n’ihu ime ihe osu ga-ahụ ihe o koteere onwe ya.

O ruwo oge iji kwụsị ihe a ma jikọọ ndi be anyị ọnụ maka ọbụbọ chi ọhụrụ. Oge eruwo maka nlọta ụmụnne anyị erere n’ohu. Anyị dị nkwadebe ịkpụ arụ maka njọ nnanna anyị ha nakwa njịkọ ọnụ nke anyị n’ụmụnne anyị ndi si Amerịka, Yurop nakwa mba ndi ọzọ.

Leave a Reply

Your email address will not be published.