UDE NCHAWA AHỤ:AKATỌỌLA BLAC CHYNA

Spread the love

 

Ụmụamaala Naijirịya anọrọla n’ọba ozi mmekọrịta (social media ) dị iche iche were katọọ Blac Chyna, nwanyị ogosi uwe (model) maka ịgbasa ozi azụmahịa maka ude nchawa ahụ ọ na-akwado ime na Legọsị.

Ya bụ nwa-afọ Amerịka dị iri afọ atọ ga-amalite njem mbụ ya na Naịjiriya site na inwe mmemme awantịlọ n’akụkụ ọdọ mmiri (poolside party) n’Abụja n’abalị iri abụọ n’anọ nke ọnwa a tupu ọ gawa Legọsị echi ya.

Ude nchawa ahụ a nke a na-ere Puku Naira iri itolu n’otu maka otu ololo ebutela oke nkatọ n’ọba ozi mmekọrịta dị iche iche.

Ụmụ amaala Naịjiriya nọrọ n’ọbaozi mmekọrịta dịgasị iche iche tinyere twitter nakwa instagram were katọọ ya ma kọwakwaa na ndi naịjiriya anaghị ahụta ude nchawa ahụ ka ezigbo ihe.

Otu onye bụ@SincerelyTops kwuru na twitter sị, “Blac Chyna ya na eze nakwa eze nwanyị ude nchawa ahụ mba Afrịka ijikọ aka ọnụ mepụta ude nchawa ahụ ọhụrụ abụghị nọọ na o nyere nsogbu

“ọ na-akpasu m iwe, ọ nwaghị anwa mee udiri ihe a na LA, USA.

Nke a bụ iji nsogbu ndi Naịjiriya nwere banyere ịcha ọcha were nyụọ anyị anya”

hoo!haa!! na-ajụzị sị: “ọ bụ na o nweghị ihe bara uru Blac Chyna nwere ike iwetara ụmụnne ya ndi isi ojii ibe ya ndi Naịjiriya?

2 Comments

  1. Ọ bụ onye ọmasịrị ga-azụrụ ude ahụ. Ọ nweghị mgbakasị ahụ dị na ya. Ahụ bụ nke onye ahụ; ego bụkwa nke onye ahụ.




    0



    0
  2. top racing games pc
    I simply had to say thanks once more. I am not sure the things I would’ve followed without the actual hints discussed by you relating to such topic. It was actually the fearsome matter for me personally, but coming across the very expert technique you handled that made me to leap with gladness




    0



    0

Leave a Reply

Your email address will not be published.