ORIRI NCHETA ỊGBA AFỌ “ENERGY”

Spread the love

Enugwu: Ụlọ erimeri Sizzlers nke nọ n’ogige Polo Park Mall kpọtụrụ akpọtụ n’ụbọchị Wenzdee, abalị iri n’abụọ nke ọnwa Disemba afọ 2018 mgbe Injinịa Agọzie Ibekinwa mere mmemme ncheta ịgba afọ ya.

Mazị Agọzie Ibe onye nke e ji “Energy” mara kelere Chineke maka ihe ọma nile o mere ya. Ọ rịọkwara Chineke maka ezumike ezigbo nne ya nke nwụrụ na nso a.

N’okwu ya, onyeisioche mmemme ahụ bụ Ichie Kingsley Okeke, onye nke e jikwa Ọsama were mara gọọrọ Agọzie bụ ezigbo enyi nakwa nwa ọrụ ya ọfọ ka Chineke gọzie ya ma nyekwa ya eje alọ. Ọ rịọkwara ka Chineke nye ya ọmụmụ.

Ya bụ onyeisioche, onye ndi obodo ya bụ Ogboli-Awgu họpụtaworo ka e chie Igwe tokwara Energy dịka nwoke na-agba mbọ ma nwekwaa mụọ inyere madụ aka

Leave a Reply

Your email address will not be published.